Pornography: A maala ọkwa ka a kwụsị iji ATM kaadị ele ndị gba ọtọ n'intanetị

A maala ọkwa ka ndị ụlọọrụ na-enye Kadị eji ego ihe ma ọ bụ were ego n'igwe ATM ka ha kwụsị inye oghere ka e jiri kaadị ha akwụ ụgwọ n'ịntanetị.
Ọ bụ ndị otu zuru ụwa na-ekwu ka nke a mee.
Otu ụlọọrụ na-ere ihe onyonyo ndị na-eme mmekọ ahụ bụ "Porn Hub" kwuru na ọkwa a bụ eziokwu ma bụrụ kwa asị".
Ndị ụlọorụ Mastercard kwuru na ha ga-ewepụ websaịt ọbụla ha chọpụtara na-eme ihe na ezighị ezi na ndị ha na ha na-arụko.
Ndị bidoro iti mgbu a degara ụlọọrụ ndị na-eme kaadị e ji akwụ ụgwọ iri nke gụnyere Visa, MasterCard na American Express.
Ndị otu a sị mba Briten, India, Uganda na Ọstralịa.
Ọrụ otu ndị a bụ ihu na mmegịde ụmụaka n' ịgba mgbere mmadụ kwụsịrị.
Mmekọ dị njọ na-eme na Intanetị
Websaịt na-ere mmekọ nwoke na nwaanyị a kpọrọ 'pornhub' so na ndị ha ji maa ọkwa a.
N'ọnwa Ọktoba ka e jidere otu nwoke gbara afọ iri ato si obodo Florida aha ya bụ Christopher Johnson ma gbaa ya akwụkwọ maka ịwakpo nwa dị afọ iri na ise ma tinye ya na 'Pornhub.'
Kama ndị ụlọọrụ 'Pornhub' na-ekwu na ha na-ewepụ ihe onyonyo mmeko nwoke na nwaanyị na-ezighi ezi.
Dịka ọ dị ugbu a, ụlọọrụ ndị na-eme kaadị a ndị gụnyere Visa na Masrercard ka na-ekwe ka ndị mmadụ kwụo ụgwọ ịle mmekọ nwoke na nwaanyị na websaịt dị iche iche.













