Alkaline water: Nke bụ eziokwu gbasara 'Alkaline water'

Ebe foto si, Getty Images
- Onye dere ya, Chris Sanctus Okereke
- Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist
Mmịrị bụ ndụ bụ okwu ndị Igbo na-ekwu kemgbe ụwa.
Nke a pụtara na nwafọ ọbụla maara na ịṅụ mmịrị bara ezigbo uru n'ahụ mmadụ.
Mmụta gosiri na mmiri dị, mmiri dikwa.
Ọ nwere nke ha na-akpọ mmiri nwere "alkaline", ya pụtara na akalaịn dị n'ime ya gbagotere.
Mmụta a na-ekwu na ọtụtụ mmiri anyị na-aṅụ enweghị akalaịn ruru ka achọrọ.
Nke a pụtara na ọ bụ naanị asidi ka ha nwere.
Ndị otu mmụta a na-akọwa na ọ bụ nri maọbụ mmiri nwere akalaịn bụ kpoo.
Ọ nwekwere ọtụtụ ndị ama ama bu okwu akalaịna n'isi ọkachasị n'ala Bekee.

Ebe foto si, European Photopress Agency
Udi mmadụ dịka otiegwu Beyonce nakwa elewe ejeghị ọrụ bụ Miranda Kerr.
Ndị a na ọtụtụ ndị ọzọ bụ ndị na-akọwa na mmiri akalaịn bụ ịgba n'ahụike mmadụ maka na ọ na-agwọ ọrịa, ma na-egbochikwa ọrịa kansa, eme ka onye buru ibu fochanata ma na-emekwa ka ahụ mmadụ na-
akwọ mụrụ mụrụ. Ụfọdụ n'ime ha sịkwa na nri na mmiri akalaịn na-emekwa okonye aka nka.
Okwukwe ndị a bụ na asịdị na-eme ka ọrịa na-eto mmadụ na ahụ mana ọ na-ahịa ahụ ka ọrịa too n'ime ahụ nwere akalaịn otu achọrọ. Lisa Drayer bụ onye wetegoro ọtụtụ nturu ugo n'ihe gbasara nrị na
ndozi ahụ, bụrụkwa onye ntaakụkọ ihe onyonyo na-okwu gbasara nri na ịchọmma kwenyere na "akalaịn na-enye aka ịgbarị asịdị n'ọbara mmadụ ma nwekwaa ezigbo uru ọ bara n'idozi ahụ mmadụ'.
Mana Anselem Obeta bụ dibịa ọnatarachi bụ otu n'ime ndị ji usoro ọnatarachị agwọ ọrịa sị na ndị ahụ amaghị ihe na-ekwu. Ọ sị na ya malitere iji mmiri akalaịn agwọ ọrịa kemgbe 2015. Obeta sị na "e ji m ya
gwọọ nwunye m mgbe ọ nwere ọrịa obi".

Ebe foto si, Ebelechukwu Ilo
Ebele Ilo bụ nwaanyị gbara afọ iri iri isii sị na "kemgbe m malitere ịṅụ mmiri akalaịn a ihe niile na-eme alaala. Ebele bụ onye ṅụgọrọ mmiri a ọnwa asatọ sị na ọ gwọrọ ya anya mgbu, ọkpa mgbu na afọ mgbu
na-enye ya nsogbu kemgbe.
Gịnịdị bụ akalaịn a ana-ekwu maka ya?
Ihe akalaịn na-akọwa bụ ọnụọgụ pH dị na mmiri ọbụla. Nke a pụtara na pH bụ ọnụọgụ eji atụ asịdị maọbụ akalaịn dị n'ihe. Ọnụọgụ a na esi na efuu ruo iri na anọ (0 - 14). Nke a pụtara na ihe nwere otu pH
bụ asịdị nke nwere pH asaa gbagowe bụ akalaịn maọbụ base.
Mmiri akalaịn na-enwe pH karịri mmiri nkịtị anyị na-aṅụ.
Akalaịn bụ mmiri pH ya gbadotere karịa mmiri nkịtị anyị na-aṅụ. Nke a mere ọtụtụ ji ekwu na ọbụrụ na mmadụ ṅụo mmiri akalaịn nke ukwuu, na ọ ga-enye aka gbarie asidi dị onye ahụ n'ahụ.
Akwụkwọ akụkọ Healthline na-akọwa na ọbụghị naanị na pH gbagotere mere ka mmịrị akalaịn bụrụ kpoo, ihe ọzọ bụ na ya bụ mmiri kwesiri ịnwe ihe ndị ọzọ na-enyere ndụ aka Bekee kpọrọ 'minerals' na
nke ha kpọrọ "negative oxidation reduction potentials" ( ORP). Ọ bụ ORP a mere ka ya bụ mmiri nwee ike iwepụ ụnyị nke ime ahụ bụ "antidoxidant", na Bekee.

Ebe foto si, Getty Images
Ya bụ pH dị na ọtụtụ mmiri nkịtị anyị na-aṅụ erughị asaa. Asaa bụ okeala asidi na akalaịn maọbụ "base' dịka Bekee kpọrọ ya. Mmiri pH ya erughị asaa bụ asịdị mana nke si n'asaa gbagoo asatọ maọbụ itoolu
bụ akalaịn. Mmiri pọmpu ụfọdụ dị mma na-ejisike eru pH asaa, nke pụtara na ha bụ asịdị.
Malinda Malkani bụ isiahụrukwaokpu n'ihe gbasara erimeri sị na ihe mere mmiri o jiri bụrụ akalain bụ maka na o nwere nnu na metalụ n'ime ya.
O kwukwara na ihe kacha ebuta mgbanwe na pH dị na ọbara mmadụ bụ ọrịa.
Ọ chọpụtakwara na ụdị nrị mmadụ na-eri nwere ike ịme ka asidi gbagote na ọbara onye ahụ. Ebe ọrịa uhe (Kidney) nwere ike ịmekwa ka akalịan onye ahụ gbagote. Ọtụtụ nri dịka miliki, bụredị, nri eghere
eghe, bọta, akwa na ndị ọzọ nwere ike iweli asịdị di na ọbara gị.
Ebee ka mmiri akalaịn sị abịa?
Mmiri akalaịn bụ ọnatarachị na-esi na mmiri ọgbanaokwute ụfọdụ apụata. N'elu okwute ọ na-agba ka o sị enwete akalaịn ya. Ọnwekwere mmiri akalaịn bụ akamere. Ndị kọmpịnị ụfọdụ na-arụpụtakwa nke ha
n'ololo dịka ụdị nke esi na mmiri ọgbanaokwute dị n'Ikogosi n'Ekiti steeti.
Ụfọdụ chọrọ ime nke ha nwere ike ipinye lemonụ na mmiri.

Ebe foto si, Getty Images
E nwekwara ololo latrik na-enye aka eme ka mmiri agbanyere na ya ghọọ akalaịn site n'ije Bekee kpọrọ 'water ionizer' bụ nke ga-ekewa akụrụngwa mmiri ahụ ụzọ abụo wepu asịdị dị na ya hapụ akalaịn.
Gịnị ka sayiensi kwuru maka mmiri akalaịn?
Nke bụ eziokwu bụ na ọnwebeghị ihe nchọputa kwuru gbasara ka akalaịn ọ dị mma ka ọ dị njọ n'ahụ, dịka Malkani si kwuo.
Malkani na-eche na "nke ahụ bụ otu n'ime akụkọ na egwu Mike Ejiagha ndị mmadụ na eforo onwe ha ịsị na mmiri akalaịn na-agwọ nta agwọ imo. Ojikwa agwọ kansa, agwọ gbogbotigbo".
Drayer na onwe ya kwuo na ya bụ echiche ndị mmadụ gbasara mmiri akalaịn enweghị mgborogwu na sayensi cha cha.
O kwukwara na nchọpụta niile e megoro gbasara mmiri akalaịn bụ ka o siri metuta ụmụanụ.
Drayer kwuru na "onwebeghị nchọpụta e mere na ya bụ ihe ka o si metuta mmadụ".

Ebe foto si, Getty Images
Malkani na onwe ya sị na "ọbụru na ahụ mmadụ na-arụ ọrụ nke ọma, ọnweghị ihe ga-eme pH dị na ọbara onye ahụ". Ọ sị na ọ bụ amaghị ihe ka ndị mmadụ ji iche na ya ga-erite maọbụ ṅụta akalaịn n'ọnụ.
Drayer sịkwa na oke akalaịn n'ọbara nwekwara ike ibutere mmadụ akpụkpa n'ahụ maọbụ afọ mgbụ.
Mmadụ abụọ a kwenyere na ahụ mmadụ nwere ihe niile ọchọrọ iji hụ na asidi maọbụ akalaịn dị mmadụ na aṅụ akarịghị ibe ya na ahụ.
Mana nchọpụta e bipụtara na akwụkwọ nchọcha akpọrọ "2012 study" nke ndị National Institute of Health n'Amerịka bụ nke a nakwanyere nke ugwuu sị na ịṅụ mmiri akalaịn nke pH ruru 8.8 nwere ike ịgwọ
obi ịchaọkụ Bekee kpọrọ "acid Reflux".
Akwụkwọ akụkọ Healthline kwukwa na nchọcha ọzọ chọpụtara na mmiri akalaịn nwere ike ịgwọ ọrịa shuga, ọbara mgbalielu nakwa abụọ ọjọọ dị na-akwara Bekee kpọrọ "high cholesterol".
Ya bụ akwụkwọ akụkọ dekwere nchọcha e mere nso nso a bụ nke otu narị mmadụ so n'ime ya chọpụtara ihe dị iche n'etiti ndị na-anụ mmiri akalaịan na ndị anaghị aṅụ ya.
Ya bụ nchọpụta gosiri na akalaịn ji ihe dịka pasent 6.3 butuo mkpụkọ ọbara karia ndị anaghị aṅụ ya bụ nke ha ji pasent 3.36 were rịdaa.
Nke a pụtara na ọbara ndị na aṅụ mmiri akalaịn na-ekwo nke ọma karịa nke ndị anaghị aṅụ ya.
Agbanyeghị ihe ndị a, ndị sayensi sị na ọ bere nchọcha a ezughị n'ime ka ekwetacha ihe niile ndị bu ya bụ ọgụ n'ise kwuru.
Ihe akalaịn nwere ike ime gị n'ahụ
Ọ bụ eziokwu na ịṅụ mmiri akalịan dị mma n'ahụ mana ọ nwekwara ike ibutu asidi dị n'afọ nke na-enye aka ekwe nri ma na-egbukwa ụmụ nje n'afọ, na-egbochi ha n'ịbanye n'ọbara.
Ọzọ bụ na oke akalaịn n'ahụ na-ebute ọnọdụ Bekee kpọrọ "Alkalosis" bụ nke nwere ike igosipụta dịka agbọ, aka ọmajijiji, mọzụlụ ịmajijiji, maọbụ uche efu.
A sịkwa na ọ nwere ike ime ka kalshum mmadụ gbadaa bụ nke nwere ike imetụta ọkpụkpụ.
Obeta sị na mmiri akalaịn na-enye nsogbu n'ahụ bụ nke akamere. Ọ sị na nke ọnatarachị nakwa nke eji ọkụ latrik mee enweghị nsogbu ọbụla.
Mana ruo mgbe sayensi ga-eme nchọcha nke juru ha afọ, ndọrọ ndọrọ dị na mmiri akalaịn agaghị ebi.









