Water Scarcity: 'Anyị amaghị ihe bụ mmiri gọọmentị na ọwụwa anyanwụ'

Ebe foto si, Chiagozie Nwonwu
- Onye dere ya, Chiagozie Nwonwu
- Ndị mere akụkọ a, BBC Igbo
Otu ihe ntaramahụhụ jikọrọ steeti niile dị na ọwụwa anyanwụ bụ ụkọ mmiri.
Mmiri so n'ime ihe ndị kachasị mkpa n'ụwa nke mere ndị otu 'United Nations General Assembly' ji kpebie n'ọnwa Jụlaị nke afọ 2010 na ịnweta mmiri so n'ikike dịrị onye nke Bekee kpọrọ "human right".
A kpọrọ ikike a "Human Rights to Water and Sanitation" (HWS).
N'agbanyeghị na Naịjirịa so n'ime mba ndị binyere aka n'ikike a, na otụtụ steeti ọkachasị nke ọwụwa anyanwụ, ndị mmadụ amaghị ihe bụ na mmiri na-agba n'ụlọ nke ha ji a ma na ọ bụ gọọmentị ka ọdịịrị inye ha mmiri.
Na steeti Anambara, Enugwu, Ebonyị, Imo na Abịa, ndị ha na BBC Igbo kparịtara ụka sị na ha amaghịdị ihe bụ na mmiri na-agba na igwe mmiri gọọmentị.
Otu onye bi Enugwu sị na o ruola afọ iri mmiri gbadebere na mpaghara ya bi n'Enugwu.

Ebe foto si, Chiagozie Nwonwu
N'Anambara
Ọ bụ n'ọchịchi Chinwoke Mbadinuju ka mmiri gbara na pọmpụ n'Ọka ikpeazu.
Uche Nwonwu bụ nwata akwụkwọ na Mahadum Nnamdi Azikiwe sị na ebe ha bi n'Ọka enweghị mmiri ma ncha.
Ọ sị na "ọ bụ mmiri ndị mmadụ gbapere na be ha ka ha na-aṅụkarị."
Mmiri gọọmentị kwa ụbọchị ụka
Nwaada Nwonwu sị na enwere nnukwu tankị mmiri gọọmentị tinyere n'Ifite Ọka na-agba sọsọ ụbọchị ụka.
Dịka o si kọwa; "Ọ bụ n'ụbọchị ụka, ma ọkụ larịk dị, ka a na-agbanye mmiri n'ebe ahụ.
"Ọ na-amalite n'elekere asatọ nke ụtụtụ, a gbachie ya n'elekere abụọ nke ehihe. O na-abụkwa sọsọ oge ọkụ dị ka nke a na-eme."
Mgbe ọzọ, ọ na-abu site n'ihe Bekee na-akpọ "bore hole" ka ndị mmadụ si enwete mmiri.
Otu ihe a na-emekwa na mpaghara niile na steeti Anambara.
N'Enugwu

Ebe foto si, Chiagozie Nwonwu
Ọ bụ sọsọ n'ụfọdụ mpaghara isi obodo Enugwu steeti ka ndị mmadụ na-ahụ mmiri si n'aka gọọmentị.
Emeka Ike bụ onye ọrụ Bekee gwara BBC Igbo na ọ na-ete ezigbote aka tupu mmiri si n'aka gọọmentị agbaa n'Enugwu nke mere ka ọtụtụ mmadụ na-echu mmiri n'awa mmiri, na 'bore hole' maọbu na tanka na-ere mmiri.
Ọ sị; "Ndị tanka a na-esi 9th mile egote mmiri ha na-eresi ndi mmadụ."

Ebe foto si, Chiagozie Nwonwu
Maazị Ike sị na mmiri so n'ihe kachasị enye nsogbu n'Enugwu.
Ka ọ kwụ ugbua, ọ bụdị sọsọ obodo Enugwu ka enwere isi mmiri gọọmentị na-agbanyeghị na nke dị adị achịtaghịdi aja ma ncha.
N'Imo
Paul Chukwu bụ onye ntaakụko gwara BBC Igbo na ọ bụ kemgbe ọchịchi Ikedi Ohakim ka mmiri gbasọrọ n'Owere.
Dịka o sị kwuo; "Ọ bụghị na mmiri na-agbabu ọfụma na mbụ, mana ọ kwụsịrị kpamkpam n'ime afọ asato Rochas Okorocha chịrị"
Maazị Chukwu sị na gọọmentị ọhụrụ n'Imo na-ekwuzi okwu ime ka mmirị malite ịgba ọzọ mana ọ ka bu okwu ka ha na-ekwu.
Kelechi Enyoghasim bụ nwata akwụkwọ n'Owere sị na ọ bụ na 'borehole' ka ha si enweta mmiri.
Ọ sị na ya amaghị etu mmiri gọọmentị na-adị.
O kwukwara na, "anyị nwere 'borehole'. Ọ bụ ebe ahu ka anyị si agbata mmiri."
"Ọ na-abụkarị na ndi mmadụ na-arụ ụlọ na-egwu bore hole n'ime ya. Ndị mmadụ adịghị ele gọọmentị anya."
N'Abịa
N'Aba Chidi Ikeh gwara BBC Igbo na onweghi ihe dị ka mmiri gọọmentị na-agba n'igwe n'obodo ahụ nke o ji adị na steeti Abịa niile.
Ọ sị, "Ọ bụkwa 'borehole' ka ndị mmadụ ji enyere onwe ha aka."
"Ihe anyị ma si n'aka ndị omeiwu bụkwa 'borehole' mana ọ dịghị arụ ọrụ ọfụma.
"Ihe mmiri ha na-adịkarị n'ime nnukwu tanka na-eji igwe ọku arụ ọrụ. Ha emechiela."
N'Ebonyi

Ebe foto si, Chidi Ikeh
Dịka Obinna Udenwe bụ onye ode akwụkwọ nakwa onye ndọrọndọrọ ọchịchị siri gwa BBC Igbo, Ebonyi steeti nweburu mmiri gọọmentị na-agba n'Abakiliki ruo pacentị 30 tupu Martin Elechi amalite ọrụ mmiri na Oferekpe na Ukawu.
"Martin Elechi rụru ọrụ mmiri a ruo Abakiliki. Ihe fọrọ bụ ka ewere igwe mmiri tinye n'ụlọ ndị mmadụ. Mana kemgbe aka na-achị steeti a ugbua bụ Dave Umahi bịara, ọrụ a kwụsịrị," MaazỊ Udenwe kwuru.
Ọ gakwara n'ihu kwuo na ezigbote ego banyere na ụrọ mmiri a nke mere o jiri dị mkpa ka arụcha ya.
Ọ sị na ọ bụ na bore ka ndị mmadụ na-echu mmiri.
Maazị udenwe sị; "Ọ bụ na "roundabout ka anyị na ahụ mmiri gọọmentị. Abịa a gbape mmiri bore a ga-eji na-enye "water fountain" mmiri. Ya bịazịa ọ dị ka mmiri a na-agba n'Ebonyi."

Ọnọdụ a ọ ga-abịa na njedebe na nso nso a?
N'ọnwa Maachị nke afọ 2019, onye bụbụ Kọmịshọna na-ahụ maka ihe Bekee kpọrọ "Public Utilities" na steeti Abịa gwara ndị ntaakụkọ na gọọmentị Abịa na ngalaba enyemaka mba Amerịka akpọrọ "United States Agency for International Development' (USAID) na-akpa nkata iji hu na igwe mmiri kpọchara nkụ gbara mmiri ọzọ.
Ọ sịkwa na gọọmentị Abịa na-achụkwa nta ibite ego n'aka otu ụlọakụ dị na mba Belgịọm maka okwu mmiri a.
Abịa sọ n'ime steeti isii USAID họpụtara maka atụmatụ a na Naịjirịa.
Mana ndị gwara BBC Igbo okwu na steeti ahụ sị na onwebeghị ihe ha hụrụ.
Enugwu nwere atụmatu ha kpọrọ "Oji River Water Scheme", mana dịka ihe di n'ala gosiri, atụmatụ a adịghị enye ndị Enugwu mmiri ha chọrọ.
Kọmịshọna ha-ahụ maka mgbasaozi n'Enugwu bụ Chidi Iroh sị na ọ bụ ọkụ bụ isiokwu ha nwere n'atụmatu ịhụ na ndị Enugwu nwere mmiri.
ỌỊ sị, "Anyị nwere ebe esi enwete mmiri n'Ajali nakwa Oji River. Anyị nwekwara ebe 'borehole' juputara na Ngwo nakwa Nsude.
"Kemgbe gọọmenti anyị bịara, anyị mere ka mmiri n'erute Enugwu si ihe Bekee kpọrọ 'cubic metres' puku ise ruo puku iri."
Ọ sịkwa na ihe ha chọrọ bụ ka o ruo cubic metre otu puku narị na iri abụọ.
Ọ sịkwa na ha nwere atụmatu enyemaka banyere mmiri si aka ụlọ aka mmepe mba Frans.
Kọmịshọna mgbasaozi n'Amambara steeti bụ Don Adinuba sị na ọ bụ Kọmịshọna na-ahụ maka "Utilities" nwere okwu a, mana BBC enweteghi ekwenti ya.
Etu a ka ọ dịkwa na nke Ebonyi steeti.
Nke bu eziokwu bụ n'agbanyeghi ihe gọọmentị niile a na-eme, ọrụ dị ka bụ atụrụ tawa.












