World Water Day 2022: 'Anyị enweghi mmiri ọṅụṅụ n'obodo Ezeukwu, Abia Steeti'
Ndị obodo Ezeukwu-Alayi dị n'okpuruọchịchị Bende nke Abia Steeti etiela mkpu na ụdị ahụhụ ha na-ata ikute mmiri ọṅụṅụ mgbe ọkọchị.
Otu nwaanyị a kpọrọ Nnenna Anyim gwara BBC Igbo na ahụhụ a bụ nke ọ malitere ịta n'oge ọ bụ nwata ka ọ ka na-ata ruo ugbu ọ lụrụla di.
Ọ sị na ọ ewe ya awa abụọ iji ụkwụ a gaa ihe ruru kilomịta ise ikute mmiri ma lọghachị.
Nnenna sị na ụkọ mmiri a na-akawanye njọ n'oge ọkọchị dịka iyi ndị dị ha nso na-atachasị kpamkpam.
Na-agbanyeghi na mmiri ha na-enweta anaghị adị ọcha n'anya, ọ sị na onweghi ihe ọ na-eme ha n'ahụ ma ha ṅụọ ya maọbụ were ya sie nri.
Ọ gara n'ihu kwuo na ọtụtụ ndị obodo ha nwere ego agbalịala igwu 'borehole' mana mmiri na-apụta na ya na-atọ nnunnu.
Ọ rịọrọ ka gọọmentị gbatara ndị obodo Ezeukwu-Alayi ọsọ enyemaka, iji mee ka ha nweta ezi mmiri ọṅụṅụ n'obodo ha.
Ihe i kwesịrị ịma maka Ezeukwu
Ezeukwu bụ obodo dị n'okpuruọchịchị Bende nke dị n'Abia Steeti.
Ihe e jiri maara ndị obodo a bụ ịkọ ugbo ọfụma nke gụnyere ji akpụ, ji, imepụta mmanụ nrị nakwa akụrụngwa ndị ọzọ.
Maka etu ala ha si dị mma n'ịkọpụta ihe ubi na-ejighi fatilaịza mere e ji a kpọ ha 'land of fertility' nke pụtara ala ọmụmụ.
Ọ bụ isiobodo (Autonomous Community) abụọ mejupụtara Ezeukwu nke gụnyere; Ezeukwu na Isiala/Amaelu.
Ndị Eze ọdịnala abụọ na-achị obodo ndị a bụ Eze Ogwo Chukwu (Ezeukwu) na Eze Kalu Okorie (Isiala/Amaelu).
Obodo ndị gbara Ezeukwu gburu gburu gụnyere Ugwueke, Alayi, Isiukwuato na Isiagụ (Ebonyi Steeti).
Ndị mere ihe onyonyo a: Ikechukwu Kalu na Chiemela Peter

