Cave: Ọgba nwaanyị nọ na nsọ anaghị aba
Ọgba na Ọgbaagada dị n' Obunọfia n'Okpuru Ọchịchị Ezeagụ n' Enugwu Steeti bụ nke nwere nsọ dị iche iche nakwa ihe nribama e jiri mara ya.
Ndị obodo ahụ gwara anyị na iwu nakwa nsọ di n'Ogba gunyere na nwaanyi nọ na nsọ ya agaghị abanye na ya bụ ọgba.
Ọ ga-akachie nti banye, ọ ga-ahụ nnukwu agwọ ga-achụpụta ya.
Ihe ọzọkwa bụ na nwaanyị anaghị eyi uweimeahụ abanye ọgba ahụ, uwe agada bụkwazị ihe nsọ na ya.
N'ọgba ahụ, naanị otu ụdị anụ ka onye chọro ka o ga-egbu wee laa n'ulọ.
Ya bụ na amaghị ebe Ọgba ahụ obidoro nke a na ama ebe o jedebere mọọbụ ebe mmiri si na ya agbapụta oge niile.


Ebe foto si, BBC Igbo
Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Mmiri si n'Ọgba ahụ gbadatara wee ghọrọ obosara mmiri nke ana-akpọ Ọgbaagada.
Mmiri Ọgbaagada ahụ bụ nke ndị mmadụ si ebe dị iche iche na-abịa egwu mmiri na ya .
Ndị nchekwa mmriri a n'Obunọfia, Ezeagu kwuru na onye ọbụla nwereike igwu mmiri n'ebe ahụ mana onye anwakwala anwa kwaa iko na ya bụ mmiri.
Ha kwuru na ọ bụ ọru ha igwa ndị ọbula na-abịa nleta na ya bụ ebe ọkachasi ụmụakwụkwọ, ihe ndịa na-asọ nsọ.
Onye ọbụla nupuru isi n'ihe Ọgba na Ọgbaagada ahụ na asọ nsọ na-enweta ntaramaahụhụ ya ozigbo.












