Anambra state: Lee ihe Eze Umumbo na Omor kwuru maka ọgbaaghara dara n'etiti ha

Ebe a na egwupụta mmanụ agbịdị

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ihe a bụ foto ochie

Dịka ọgbaaghara dara n'etịtị obodo Omor na Umumbo, ọtụtu akụkọ na-efegharị n'Intanetị kama onweghị onye ma nke bụ eziokwu.

Mana otu ihe pụtara ihe bụ na ọ bụ nsogbu ala butere ya bụ esemokwu.

Ndị mgbasaozi nke Anambara steeti kwuru na mmadụ iri ise bụ ndị a na-achọ achọ ebe ihe ruru mmadụ narị atọ bụ ndị e ji mgbọ egbe na obejiri merụọ ahụ.

BBC kpọtụrụ ndị uweojii na ndị Eze obodo abụọ a ka anyị mata ihe mere.

Ihe ndị uweojii kwuru

Ndị uweojii kwuru na ọ bụ otu onye nwụrụ ebe mmadụ anọ merụrụ ahụ.

Ha kwukwara na ha ejidele mmadụ asatọ aka ha dị n'ihe mere.

Ihe ndị Eze obodo ndị a kwuru.

Igwe Oranu Chidume

Ebe foto si, Igwe Oranu Chidume

Nkọwa foto, Igwe Oranu Chidume

Igwe Oranu Chidume nke obodo Omor na Igwe Solomon Ikechukwu Chidubem nke ndị Umumbo kwuru na ha bụ ụmụnne na-emekọ nke ọma.

Ha kwuru na ọ bụ ndị na-akọ osikapa bụ ndị butere ya bụ okwu.

Gere ihe ha kwuru n'uju ya ebe a.

Aha onyonyo, Esem okwu n'etiti obodo Ummbo na Omor

Dịka ọ dị ugbu a, ndị nchekwa nọ n'obodo abụọ ndị a. Ugbụ a bụzị oge udo dịka ndị Eze abụọ siri kwụọ na ha na-agba mbọ ihu na udo batara n'obodo abụọ ndị a.

Akụkọ ga-amasị gị