Mike Ejeagha - Aghara m ihe egwu m gbaa ọsọ n'oge agha
Mike Ejeagha bụ otiegwu Igbo ama ama n’ihi egwu akụkọ ifo ọ na-eti ya.
Egwu e jiri mara ya nke wuru ewu n'afọ 70s na 80s gụnyere "Ụwa mgbede ka mma", "Ọfọ ma onye ji ya", "Gwọ gwọ gow ngwọ", "Nwaanyị mma aghara egwu jịta laa"
Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere, Ejeagha kọrọ akụkọ etu ya sị hapụ ọrụ ịkpụ isi, banye n'itiegwu.
Gee ya ihe o kwuru n'uju na nkiri a:
Ndị mere akụkọ a bụ Nnamdi Agbanelo na Chris Sanctus Okereke


