'Asymptomatic', 'Lockdown' na okwu ndị ọzọ coronavirus gbara n'anwụ

Ebe foto si, Getty Images
- Onye dere ya, Chimamaka Ihenacho
- Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist, Igbo
O ruola ọnwa ise ọrịa coronavirus nke a kpọrọ Covid-19 malitere ịcha ụwa ọkụ.
N'ime ọnwa ise a, ọtụtụ mmadụ anwụọla, ọtụtụ mba emechiela ebe okwu dị iche iche gbalitere eru ma bụrụ mbụ ụfọdụ ndị mmadụ na-anụ maka ha.
Ụfọdụ okwu "ọhụrụ" ndị a bịara dị ka ọgbara Igbo gharịị makana ọtụtụ ndị ọ bụ mbụ ha ị nụ ya aghọtaghị ihe ya bụ okwu na-akọwa.
Mana ugbua a ị batara n'akụkọ a, ụjọ atụla gị ma ọ bụrụ na okwu ndị a na-ada gị ka igwe na ntị, makana BBC Igbo ga-akọwara gị ya etu ị ga-esi ghọta ya ugbua.


Okwu ndị so coronavirus
Pandemic: Nke a bụ nke a na-akpọ ọrịa ozuru ụwa ọnụ n'Igbo.
Njirimara ya bụ na ọ bụ ọrịa na-efe efe site na mmadụ fere na mmadụ ma na-agazu ebe dị iche iche dịka n'obodo ruo obodo maọbụ site na mba fere na mba n'otu oge. Ụzọ ọzọ e nwereike isi akọwa ya dị ka ilu Igbo na-ekwu na "onye a na-agwọ ibi ọ na-eto afọ".
Index case: Nke a bụ ihe a na-akpọ onye mbụ butere ọrịa na-efe ọtụtụ mmadụ. Ọ bụ onye na-egosi na e nwere ọrịa na-efe efe. Marakwa na ọ bụghị iwu na ọ bụ onye ahụ butere ya bụ ọrịa, kama na o nwereike ịbụ onye ahụ ka e nyochara wee hụ na ọ bụ n'aka ya ka ọrịa a si gafee n'ahụ ndị ọzọ.
Herd immunity: Nke a pụtara nchekwa a na-enye ọha iji gbochie mfesa ọrịa ọkachasị ma ọ bụrụ na ọtụtụ mmadụ anatala ọgwụ mgbochi maka ya bụ ọrịa.
Nke a na-enyere aka ịhụ na ọrịa na-efe efe efesaghị ruo ndị na-ebutebeghi ya, n'ihi na ndị ihe dị n'ime ahụ mmadụ na-alụso nje ọgụ nke bụ "immunity" ha na-arụsi ọrụ ike nwereike inyere aka ikpuchite ndị nke dị n'ahụ ha akaghị aka.
Community transmission: Nke a bụ mgbe mmadụ na onye bu ọrịa na-efe efe enweghi mmekọrịta mana o butekwa ya bụ ọrịa. Ụfọdụ oge ọ bụrụkwa na onye ahụ esighikwa mba ebe ọrịa ozuru ụwa ọnụ na-akpa ike, mana o burukwa ya bụ ọrịa.
Lockdown: Nke a ka a na-akpọ mmechi obodomaọbụ mmachibido ịpụta ezi. Ihe ọ pụtara bụ na ndị na-achị obodo ahụ na-etinye iwu ịkwụsị ndị mmadụ ịpụta ezi. Nke a bụ otu ụzọ e si egbochi mfesa ọrịa n'oge coronavirus a. Ọtụtụ mba gụnyere Naịjirịa kpọchiri mba ha makana ndị mmadụ nọrọ n'ime ụlọ ghara inwe mmekọ, o nyere aka ibelata etu ọrịa si efesasị.
Vaccine: Nke a bụ nke a na-akpọ ọgwụ mgbochi n'Igbo. E nwere ụdịrị dị iche iche a na-enye maka igbochi ọrịa dị iche iche.
Ka ọ dị ugbua, a ka na-achọ ọgwụ mgbochi a ga-eji agwọ ọrịa covid-19.
Flattening the curve: Nke a bụ mgbe ndị mmadụ gere ntị n'usoro e ji egbochi ọrịa na-efe efe dịka ịnọ n'ụlọ ghara ibute ma fesasịa ọrịa a. Ndị mmadụ gee ntị ma si usoro dịka "mmachibido ịpụta ezi" ọ ga-eme ka ọnụọgụgụ mmadụ ole ga-ebute ọrịa a ghara ibu oke ibu, ma ghara iju ndị na-arụ ọrụ ahụike aka.
Ọ dị ka ebe ndị ọrụ ahụike na-asị gị "nyere m aka ka m nwekwaa ike inyere gị aka".
Immune system: Nke a bụ ihe dị n'ime ahụ mmadụ na-alụso nje na ọrịa ọgụ. Ọ bụghị oge niile mmadụ na-arịa ahụ ka o kwesịrị ịṅụ ọgwụ.
Ndị ọkammụta sayensị na ihe gbasara ahụike na-ekwu na ụfọdụ oge ọ na-adị mma iji nri na-edozi ahụ akwalite ime ahụ gị ka ị gbasie ike ma nwee ike ibuso nrịanrịa agha na-aṅụghị ọgwụ ọbụla.
A na-eji akwụkwọ nri, mkpụrụosisi nakwa ihe ndị ọzọ dị iche iche akwalite ime ahụ mmadụ iji chebiri mgbe ọrịa dị aṅaa ga-ewelite isi.
Asymptomatic: Nke a bụ mmadụibu ọrịa na-efe efe mana ọ naghị egosi ya n'ahụ.Etu a ọrịa coronavirus na-efegharị, e nwere ụfọdụ ndị bu ya mana ọ naghị egosi n'ahụ ha, ọ naghị akutu ha, ha na-agara ụwa ha mkpa ha.
Isolation: Nke a bụ ịkpọpụ onye bu ọrịa na-efe efe n'ime otu ebe e wepụtara maka nlekọta ha, ka ọ ghara ibunye ndị ọzọ ya bụ ọrịa.
Ụfọdụ oge ọ na-abụ n'ụlọogwụ, ụfọdụ oge ọ bụrụ ebe a rụpụtara maka nlekọta ndị bu ọrịa.
Self-isolation: Nke a bụ ọnọdụ nnọrọ onwe, mgbe onye na-enyo ma o nwereike ibu ọrịa a maọbụ onye bu ọrịa a ga-ejiri aka ya chịba ụkwụ n'ụlọ ghara ịpụta ezi, gbajọọ ya na ndị ọzọ inwe mmekọ nakwa ime ihe ndị nwereike ime ka o bufee ndị ọzọ ọrịa.
Onye ahụ ga-anọrọ onwe ya naanị ya; ọ ga-azụrụ nri ya n'ịntanetị maọbụ jiri ekwentị zụta ma nri, ọgwụ na ihe ndị ọzọ dị ya mkpa, ghara ịpụta ezi.
Quarantine: Nke a bụ mgbe a kpọpụrụ onye ya na onye bu ọrịa na-efe efe nwere mmekọ, iji lelee ya ma hụ ma ọ ga-ebutekwu ọrịa ahụ, ma mekwaa ka ya na ndị ọzọ ghara inwe mmekọ mgbe a na-elele ya.
Onye a na-etinye na "quarantine" bụ onye nwereike ọ maghị na ya na onye bu ọrịa a enweela mmekọ, maọbụ na o bu ọrịa a mana ọ naghị egosi ya.
Social-distancing: Nke a bụ ịgbara ndị mmadụ ọsọ ka gị na mmadụ ghara inwe mmekọrịta makana ị maghị onye bu ọrịa na-efe efe.
Nke a bụ na ị nwereike ịpụ apụ mana ị gaghị aga mmadụ nso, o kwesịghị ka onye ọzọ jiri ihe dị ka mita abụọ ruo isii ruo gị nso.
Palliative: N'ezie, "palliative" bụ nlekọta a na-enye onye nwere ọrịa na-enweghi ọgwụgwọ iji mee ka ihe mgbu ya belata, mana na Naịjirịa, ọ bụ ihe gọọmentị na-akpọ enyemaka a na-enye ndị enweghị etu ọ forọ ha ka ha wee nwee ike jikwata onwe ha.
Ọ bụ ihe gọomentị na ụfọdụ ndị mmadụ na-eke ndị nọ n'ụbịam ka ha nwee ike ji chedo afọ ha n'oge "ụwa yagara ayaga" a.
Stimulus package: Nke a bụ ihe gọọmentị ji enyere ụfọdụ ndị ọ na-achị aka n'oge ihe ndapụta dịka ugbua ọrịa ozuru ụwa ọnụ na-efegharị.
Ọ bụ ihe ụzọ a ga-esikwa kwalite akụnụba obodo n'ihi na ego ahụ a ga-enye ndị mmadụ iji nyere ha aka oge ihe ndapụta ga-alaghachikwa n'akụnụba obodo.
Hand sanitizer: Nke a bụ ihe e ji ehicha aka nke nwere mmanya ọkụ, nke na-enyere aka ibelata nje mmadụ nwereike iji aka metụta.
Curfew: Nke a bụ mmachi ngagharị maọbụ oge apụla ezi n'asụsụ Igbo.
N'oge mfegharị ọrịa coronavirus a, gọọmentị dị iche iche etinyela mmachi a ka ha gbochie ndị mmadụ ịpụ ezi aghara agahara ka ọrịa a ghara ifesasị metụta ndị ebughi ya.
N'ụfọdụ ebe na Naịjiria e tinyere iwu sị ndị mmadụ apụla ezi site n'elekere asatọ nke abalị ruo nke isii nke ụtụtụ.
Personal hygiene: Nke a bụ ọnọdụ nlekọta onwe, ebe mmadụ ga-eji aka ya hazie ma debe onwe ya na gburugburu ya ọcha.
Idobe onwe gị na gburugburu gị ọcha ga-enyere gị aka igbochi ụfọdụ ọrịa na nje nwereike ife mmadụ.
Face masks: Nke a ka a na-akpọ akwa mkpuchi imi n'asụsụ Igbo.
A na-eji ya egbochi ihe dịka ikuku aja na ikuku ọjọọ ndị ọzọ ikubanye mmadụ n'imi.
Ọ na-egbochikwa ihe dịka azụzụ, ụkwara, asọmmiri na ihe ndị ọzọ onye ọzọ kwapụtara ịtụsa gị n'imi na ọnụ, ọkachasị nke onye bu ọrịa na-efe efe.




















