Emeka Morocco Maduka anwụọla ma lakwuru ndị nna ya ochie
Akụkọ na-erụ anyị ndị ugbua bụ na otiegwu a ma ama bụ Emeka Morocco Maduka a na-akpọ 'Morroco nwa Maduka' anwụọla n'ụbọchị 29 Ọktoba nke afọ 2020 ka ọ gbachara afọ 76.
Chukwudi Avoaja bụ onye otu jikọrọ ndị na-eti egwu bụ PMAN n'ịchafụ na mpaghara Ọwụwanyanwụ ma bụrụkwa onye ya na Moroco rụkọrọ ọrụ gwara BBC Igbo n'ekwentị na ya bụ akụkọ bụ eziokwu.
"Ọ nwụrụ n'ehihie taa bụ Tọzde ụbọchị 29 Ọktoba, afọ 2020."
Avoaja gara n'ihu kọwaa na ndị otu ha na-akwadobu imere ya emume ncheta afọ ụbọchị ụka na-abịa tupu ya bụ ọdachi adapụta.
Morocco,onye Ukwulu dị n'Anambara Steeti, bụ otiegwu a ma ama n'ala Igbo ọkachasị n'iti egwu na-emetụta mmadụ n'ọkpụkpụ.
Ọ bụ otiegwu kajara akaja e ji egwu ekpili were mara.
Egwu ndị o tiri wuru ewu gụnyere " Ụba na-ese"; "Nke onye metalụ"; "Ihe onye ga-abụ ka ọ ga-abụ".
Na mkparịtaụka Ya na BBC Igbo nwere tupu ọ laa mụọ, dike Igbo ji egwu ya akpọfe ọtụtụ ndị mmadụ kwuru na ọ bụ ọrụ 'electrician' tupu ọbanye iti egwu.
Ihe onyonyo a bụ mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere n'ọnwa Julaị afọ 2019, tupu ọ nwụọ.
Gee nkọwa ya na etu ije ya siri bido n'ihe nkiri a: