Open Defecation Report: Naịjirịa bụ mba nke abụọ kachasị anyụ nsi na mbara ezi

Ebe foto si, AFP
Gịnị na-atọdị ndị mmadụ ụtọ n'ịnyụ nsị na mbara ezi?
Ajụjụ a na-abịa dịka UNICEF kpọpụtara aha Naịjirịa dịka mba nke abụọ kachasị anyụ nsi n'ụwa niile n'ọgbakọ e mere n'Ibadan.
Onye na-ahụ maka ihe gbasara ịdịọcha na ngalaba UNICEF bụ Bioye Ogunjobi kwuru na Naịjirịa bụ mba nke mbụ na-anyụkarị nsi na mbara ezi n'Africa.
O kwuru na n'ime ọnụ ọgụ mmadụ nde iri anọ na asaa edepụatara n'akwụkwọ "Water, Sanitation and Hygiene" na "National Outcome Routine Mapping"(WASH NORM), mmadụ nde iri na asaa (16milllion) si n'ugwu Hausa.
Ihe ndị ọzọ edepụtara n'akwụkwọ a:
- Ndị Naịjirịa ruru nde iri atọ na abụọ enweghị mposi
- Ụmụaka ruru puku narị otu na abụọ na-anwụ kwa afọ maka adịghịọcha mbala ezi
- North Central gbara onye nke mbụ n'inyụ nsị na mbara ezi na Naịjirịa(53.9%)
- South West gbara onye nke abuọ n'inyụ nsị na mbara ezi na Naịjirịa(28.0%)
- South East gbara onye nke atọ n'inyụ nsị na mbara ezi na Naịjirịa(22.4%)
- South-South bụ mpaghara nke anọ(17.9%)
- Ebe North East so ha na-azụ (10.3%)
Onye nnọchitere anya gọọmenti n'ọgbakọ ahụ kwuru na gọọmenti etiti na-agba mbọ ị hụ na a ga-akwụsị ịnyụ nsi na Naịjirịa na mbala ezi tupu afọ 2025 eruo.







