World Toilet Day: 'Isi nsị anaghị ekwe anyị kute ume ndụ'
Dịka ụwa niile na-eme mmemme ịkwụsị ịnyụ nsị n'okporo ụzọ ma ọbụ n'ime ohịa, BBC Igbo gara n'otu Obodo aha ya bụ Agu-Abor n'Enugwu steeti ebe ndị mmadụ ka na-aga mposi n'akụkụ ụlọ ha nakwa ime ọhịa gbara ha okiri kiri.
Otu nwaanyị bị na Agụ-Abọr, aha ya bụ Francisca Onucheta kwuru na enweghị ụlọmposi nke na echere ya na ụmụ ya aka mgba.
Ọnụcheta kwara arịrị na tupu okokpa akwaa ụtụtụ ọbula, na ya ga eteta n'ụra gaa mposi n'ihi na chi bọọ, Ndị mmadụ ga na-ekiri ya.

Lee nkiri a n'uju.
Akụkọ ndị ga-amasị gị: