Nnamdi Kanu: Ihe mere o ji jiri eluigwe tunyere Biafra

Ebe foto si, Paul Achalla/Getty Images
Paul Achalla bụ ọkaiwu otu Ipob ekwuola na Nnamdi Kanu ga-abia Naịjirịa bia zara ọnụ ya n'ikpe gọọmenti etiti kpụpụrụ ya ma ọ bụrụ na ọ hụ na Naịjirịa adịla njikere ikpe ya bụ ikpe.
Mana ụwa ka na-ajụ ma ọ bụzị mmadụ na-ekwu onye ga-eje eligwe na onye na-agaghị eje?
Nke a na-eme dịka onye ndu Ipob bụ Nnamdi Kanu kwuchara na onye ọbụla na-akatọ Biafra agaghị aga eligwe makana ọ bụ asụsụ Igbo ka ndị mmụọozi na-asụ ebe ahụ.
Gere ya ebe a:
Mana Paul Achalla bụ ọkaiwu otu Ipob kwuru na ya bụ okwu bụ eziokwu.
Achalla kwuru na onye Naịjirịa ọbụla na-emegide ndị chọrọ nnwereonwe ha agaghị aga eligwe makana eligwe kpọrọ onye ọ bụla na-emegide mmadụ ibe ya asị.
N'ọnụ ya, "Ihe a Nnamdi Kanu kwuru dị n'akwụkwọ nsọ ebe Chukwu kwuru na onye ọbụla gbara mmadụ ohu kwesiri ka ọ hapụ onye ahụ ma afọ asaa ruo."
A na-asụ asụsụ Igbo n'eligwe dịka Nnamdi Kanu si kwupute?
Achalla kwuru na asụsụ Igbo bụ asụsụ eligwe makana ọ bụghị asụsụ mmegide ya bụ ndị eligwe na-akpa asụsụ dịka agwa.
Nnamdi Kanu ka na-eme njem
Achalla kwuru na Mazị Kanu ka na-agagharị na-eme njem ịgwa Ndigbo niile bi na mba ụwa uru Biafra baara ha ma ha nweta ya.











