World Menstrual Hygiene Day: Ụzọ ịse ụmụagbọghọ ga-esi debe onwe ha ọcha na nsọ

Ebe foto si, @thriftyslayer/Instagram
- Onye dere ya, Jessica Nwankwo
- Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist, BBC Igbo, Lagos
'Menstrual Hygiene Day' bụ ụbọchị e wepụtara iche maka ikuziri ụmụagbọghọ etu ha ga-esi debe onwe ha ọcha mgbe ha nọ na nsọ.
Otu nwaanyị na-arụ n'ụlọọrụ enyemaka ebe a na-akuziri ụmụaka etu ha ga-esi debe onwe ha ọcha bụ Ijeamaka Nwizu, gwara BBC Igbo ụzọ ise nwaanyị ga-eji debe onwe ya ọcha.
1. 'Mụta kaesi arụ akwa eji anọ nanso'
Ọ bụrụ na i nweghị ego imefu n'akwa nsọ a na-etufu etufu a kpọrọ 'disposble pad' na bekee, ọ ga-adịrị gị mma ma ị mụta etu ị ga-esi kwaa nke a na-asụ asụ.
2. Gbaa mbọ gbanwe ya bụ akwa kwa elekere anọ

Ebe foto si, AFP
Nke a bụ iji gbochie mmetọ ejiji gị ma gbochikwa isi na ihe unyi ndị ọzọ nwereike ibute ọrịa.
3. Sachaa ahụ gị ọfụma

Ebe foto si, AFP
Ịsa ahụ gị ka o si kwesi ịdị bụkwa ụzọ ọzọ ị ga-esi gbochie ọrịa ndị si n'ụzọ unyi abịa n'ime ahụ mmadu.
4. Mara etu ị ga-esi tufu akwa nsọ gị ma ị mechaa

Ebe foto si, AFP
Ọ dị mma ibu mbara na gburugburu gị n'ụche ma ị na-achọ ebe ị ga-etufu akwa nsọ gị.
Ị tufuo ya n'ụzọ ezighị ezi nwereike ibute ọrịa dị icheiche.
5. Jiri ọzọ ma ị na-apụ apụ

Ebe foto si, AFP
Nke a bụ maka ịdị njikere ma gbochikwa ihe mberede ime gị n'ụlọọrụ, n'ụlọakwụkwọ maọbụ ebe ọ bụla ị jere.
Gee ihe ọ gwara BBC Igbo n'uju ebe a:

Akụkọ ndị ga-amasị gị:
































