Onye Mali rigoro ụlọelu ịzọ nwata abụrụla onye France

Ebe foto si, Reuters
Otu onye Mali gbagara ọsọ ndụ na France abụrụla onye a na-akpọ dike maka etu o siri gba mbọ zọpụta nwata dị afọ anọ chọbụrụ ị dapụ n'elu ụlọelu.
N'otu aka ahụ kwa, onyeisiala France bụ Emmanuel Macron emela nwoke ahụ a kpọrọ Mamoudu Gassama onye France, ma nye ya akwụkwọ ikike.
Mamoudou Gassama nwetara ekele nke ukwuu etu o siri ria ilu uloelu ahụ ga zopụta nwata ahu chọrọ ị dapụ.
Onyonmyo siri France gosiri ebe ọ na arị ụlọ elu ahụ nakwa ndị mmadụ na-eti mkpu ha ji agba ya ume.
Ka onyeisiala Emmanuel Macron zutere ya n'obi ukwu ndị France akpọrọ Elysee Palace, okwuru na Gassam ga abụrụzi onye France.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Ọ gakwara n'ihu nye Gassama ezigbo ekele, ma nye ya ọlaedo ma kwukwa na a ga enye ya ọrụ n'ụlọ ịgbanyụ ọkụ.
Oku mberede a Gassama zara mere n'isi obodo France bụ Paris, n'ehihe ụbọchị 27 ọnwa a bụ Mee.

Ebe foto si, AFP
Maazi Gassama kwuru na ọ na-agafe were hụ ndị mmadụ gbakọrọ n'ihu ụlọ ahụ.
"Ka m kutere nwa ahụ n'aka m, ajụrụ m ya ihe mere o jiri me ihe a omere, mana ọ zaghị m," Gassama kwuru.
Ndị ọlụ mgbanyụ ọkụ Paris kwuru na mgbe ha rụrụ ebeahụ, ha hụrụ na a zọpụtara onye nọ na nsogbu.
Akụkọ Maazị Gassama dị ka ihe onye Mali ọzọ a kpọrọ Lassana Bathily mere n'afọ 2015 mgbe ndị oyi egwu wakporo ebe a na-ere nrị.
Maazi Bathily nyere mmadụ isii aka di ka ọ kpọrọ ha gaa ebe ha zoro ma rịpụ ga kpọ ndị uweojii.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:































