Ndị uweojii egbuola onye merụrụ mmadụ 16 ahụ na France

Ebe foto si, AFP
Egbuola Redouane Lakdim bụ nwoke ahụ echere na o bu egbe gbukwa mmadụ atọ n'ime ndị o jichiri n'ime ụlọahịa na mba France.
Onyeisiala mba France Emmanuel Macron kwuru na ndị mmadụ ruru 16 merụrụ ahụ na mwakpo nwoke ahụ mere.
Akụkọ si na ọ bidoro mwakpo a n'obodo a na-akpọ Carcassonne ebe ọ wakporo otu nwoke, zuru ụgbọala ya ma gbue ya.
Ọ gbakwara otu onye uweojii egbe ebe ya na ndịwerojii ibe ya na-eme egwuregwu ọsọ n'obodo ahụ tupu ọ gaa Trèbes ga wakpo ụlọahịa dị ebe ahụ.
Mgbe o ruru ebe ahụ, ọ bara n'ime ahịa akpọrọ ''Supermarket'' na bekee ebe ndị mmadụ na-azụ ahịa jichie ha ma gbuo mmadụ atọ.
Echere na nwoke ahụ, bụ onye si mba Morocco sị na ọ kwụnyere otu ndị na eyi ndụ egwu akpọrọ Islamic State Group.
Nwoke ahụ bu egbe dị icheiche ma na-achọ ka a tọghapụ Salah Abdesalam, otu onye n'ime ndị gburu mmadụ na mwakpo mere na France n'afọ 2015.
Akụkọ kwuru na ọ bụ onye ndị na-ahụ maka nchekwa na mba France ma ama, a sị kwa na nne ya nọ n'ebe ihe a mere.
Onyeisiala mba France akpọọla ihe a mere "mwakpo na-eyi ndụ egwu ndị alakoba".

Akụkọ ga-amasị gị:










