Igbo Slangs: Lee okwu ogbe naanị ndị nwere anya n'azụ nwere ike ịghọta

Ebe foto si, Mike Ejeagha, BBC
- Onye dere ya, Uche Akolisa
- Ndị mere akụkọ a, BBC Igbo, Lagos
- Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4
Onye ọbụla toro n'Igbo mara na o nwere ụfọdụ okwu na-efefere ndị okenye n'isi maọbụ gbagwojuo ndị amaghị nke a na-akọ anya.
Ọ bụghị na okwu ndị a abụghị okwu Igbo, kama ha bụ okwu ndị toro n'Igbo ji agwa ibe ha okwu n'okporo.
BBC Igbo tụlere ụfọdụ n'ime ha nakwa etu ha si pụta ma bụrụ okwe ogbe.
1.'Akụkọ n'egwu Mike Ejeagha'

Ebe foto si, Mike Ejeagha
Ị nụtụla ka mmadụ kwuchara okwu, a sị ya na "ị na-akọ akụkọ n'egwu Mike Ejeagha"?
Ama m na i ji uche ghọta na ihe a na-ekwu bụ na onye ahụ na-akọ ihe emeghị eme, ihe agaghị emenwu maọbụ akụkọ ifo.
Mana ị ma na Mike Ejeagha bụ mmadụ dị ndụ na-eku ume rue taa?
Ejeagha, onye Ezeagụ n'Enugwu steeti, bụ onye otiegwu a ma ama egwu ya wuru ewu n'agbata afọ 1970s na 80s.
Akụkọ (ifo) na egwu bụ ihe e jiri mara ya bụ nwoke ahụ bụ ọkpụisi tupu ya abanye iti egwu.
Ụfọdụ egwu ọ gụrụ gunyere 'Elulube lube' na 'Ome ka agụ'.
Pịa ihe onyonyo ka ị hụ ihe ọ gwara BBC Igbo maka ndụ ya:
2."Holy Nwejeh!"
"Ị nụkwa! 'Holy Nwejeh'! Santa Nwegbe! Nsọ nsọ, ebube ebube."
Ị nụ ụdịrị okwu a bụ okwu akọmọnụ, ị mara na onye na-ekwu ya na-akwa gị emo. Ihe onye ahụ na-agwa gị bụ na ị na-eme ka ị dịka nsọ.
Mana 'Holy Nwejeh' abụghị okwu ntufu, ọ bụ mmadụ ka ọ bụ; onye ụkọchụkwụ Anglịkan a kpọrọ Hezekiah Okoro Nweje.
Dịka Timothy Ofoegbu, onye Anambara ọnụ na-eru n'okwu siri kọwaa, Hezekiah Okoro Nweje, onye Ọnịcha, Anambara steeti bụ onye a ma ama dịka 'Holy Nwejeh' n'ihi ezi omume ya na okwu ọnụ ya nakwa omume.
A maara ụkọchukwu ahụ bụ onye a mụrụ n'afọ 1919 maka ị na-enyere ndị ogbenye na ndị ụwa na-atụ n'ọnụ aka.
Umeala ya enweghị atụ nke bụ na oge e nyere ya ohere ka ọ bụrụ bishọpụ ụka Anglịkan na mpaghara Niger, ọ jụrụ ma kpọpụta aha onye ọzọ o chere na ọkwa ahụ ka kwesị.
A bara otu okporoụzọ 'Nwejeh' n'Ọnịcha iji kwanyere nwoke ahụ nwụrụ n'afọ 1962 ugwu.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
3. "Ị maruru Chike Obi na Maths?"

Ebe foto si, Math.buffalo.edu
"Ọ ma akwụkwọ, ọ ma akwụkwọ, ọ maruru Chike Obi?"
Chike Obi, bụ nwa afọ Igbo ụbụrụ ya na-acha ọkụ na mgbakọ na mwepụ nke Bekee kpọrọ, "Mathematics".
Ọ bụ Ọkammụta Mathematics na Mahadum 'University of Lagos'.
Lee ihe ndị ọzọ i kwesịrị ịma maka odogwu ahụ n'ime akụkọ a: Chike Obi: Odogwu Igbo ji 'mathematics' rie amusu
4. "Upe! Onye Ọma Emeka"

Ebe foto si, Nonso Akosa
Gị na mmadụ ekwutula okwu, ọ kpọọ gị, "Onye ọma Emeka'?
Ihe ọ na-achọ ịgwa gị bụ na ya achọghị alo ahụ ị na-atụnyere ya.
Mana ị ma na okwu ahụ si n'aha otu akwụkwọ Igbo ndị Prịamarị na Sekọndịrị nke Mmụọtụlụmanya J Okafọ dere?
Akụkọ ahụ ga-akọwara gị ọfụma ihe aha ahụ pụtara.
5. Ị tara akwụ ka ọ bụ etu eze gị dị?
Ihe ọ pụtara bụ na ị na-eme ihe atụghị anya n'aka gị.
Iji maatụ, i kwe mmadụ ahịa ọnụ ihe erughị ihe ọ zụrụ ya, o nwereike ịjụ gị, "Ị tara akwụ ka ọ bụ ka eze gị dị?"
6. "Ị hụla Beatie" maọbụ "ị na-agwa Beatie"
Beatie bụ mkpọbiri aha Bekee bụ Beatrice, nke a na-agụ ụmụnwaanyị.
O nweghị onye ma Beatrice nke a na-ekwu maka ya mana ihe ọ pụtara bụ na ihe i kwenyeghị n'ihe onye na-agwa gị na-ekwu maọbụ na onye na-agwa gị okwu kpọrọ gị onye amaghị ihe.
7. Reverend sista etinyela traụza

Mmadụ tie na "Revered Sister etinyela Traụza" ihe ọ pụtara bụ na ihe atụghị anya emeela.
Mana Ị ma na ọ bụ ome ihe ejije Nollywood bụ Chiwetalu Agu bụ onye e ji okwu ahụ mara?
A ma ya dịka onye na-atụpụta okwu ọchị mana ọtụtụ mgbe uche na-adị n'okwu ya.
Ụfọdụ okwu ogbe sirila n'ọnụ Agu pụta gụnyere: "Udele anyụọ nsị n'ọlta!"; "Aka ose adịghi mma n'otele," Wdg.
8. Afọ nsị
Onye buru ibu mana o nweghị ume maọbụ agba.
9. 'I ga-ahụ nke tọrọ fada'
Ihe okwu a pụtara bụ na ị ga-enweta nnukwu ntaramahụhụ.
10. 'Igbu ozu' maọbụ 'ibute ike'

Ebe foto si, Segun Oyeyemi
Igbo ejighị ego maọbụ ihe ego ga-azụtali egwu egwu.
E nwere ọtụtụ okwu ogbe metụtara ego.
"O gbuola ozu"; "Ọ pọtọọla", "O nwere ego igwe," nke pụtara na onye ahụ abaala ọgaranya ngadanga.
Ụfọdụ oge, a na-eji ụdịrị okwu a akọwa onye nwere ego amaghị ebe ego ya si, dịka a sị na "ego ya bụ ego mbute".
N'aka nke ọzọ, "Owu na-asa m" bụ okwu ogbe e jiri mara ndị bi n'Ọnịcha, Anambara steeti pụtara na "ego kọrọ m."
Okwu ogbe ndị ọzọ metụtara ego gụnyere: "Kpapụtara anyị ya ka o sie," maọbụ "Gbachaa m arụ" maọbụ "Meka sịa" pụtara, "chọrọ anyị ihe (ego)."
Okwu ogbe ndị ọzọ bụ, "Nwanne, e kogo m", "ife a sị", "nothing mega", "ị ma ife a na-arụ", "Ị makwa ndị anyị bụ", "ịgba apiriko" wdgz.
N'ezie, anyị agaghị edepụtachali okwu dị a n'ihi na ha dị agụta ọnụ. Gwa anyị nke a na-ekwu n'ogbe gị.









