Okwu atọ Buhari ji 'wụọ Naịjirịa n'ala' na mba ofesi

Ebe foto si, Aso Rock twitter
Kwa mgbe kwa mgbe, onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari na-eme ihe ndị Naịjirịa na-eji akpụ ya n'ọnụ.
Ụfọdụ oge, a na-akpụ ya n'ọnụ maka ihe dị mma, ebe ụfọdụ oge ọ bụ maka okwu na-edoghị ndị mmadụ anya ka eji akọ maka ya.
Ndị mmadụ kwuru na ọ na-ebutere ndị Naịjirịa mkparị ụfọdụ oge site n'ụfọdụ ihe ndị a ọ na-ekwu ma agbaa ya ajụjụ ọnụ maọbụ o kwuo okwu na nzukọ ndị mba ofesi.
BBC Igbo na-ewetara gị ugboro atọ Buhari kwuru ụdịrị okwu a.
Ndị ntorobịa Naijirịa gosiri iwe ha n'ihe onyeisiala bụ Muhammadu Buhari kwuru n'ọgbakọ Commonwealth e nwere na Westminister, Lọndọn, ụbọchị Wenesde ebe o kwuru na ndị ntorobịa Naijiria adịghị ike ọrụ.
Ihe ndị Buhari kwuru
- Ndị ntorobịa Naịjirịa dị umengwụ
Ka Buhari gara London maka nzukọ ndị ọchịchị mba ndị nọ n'okpuru Commonwealth, O kwuru na ndị ntorobịa Naịjirịa dị umengwụ.
O kwuru na "Pasentị iri isii n'ime mmadụ dị nde 180 n'ọnụọgụgụ, erubeghị afọ iri atọ ọtụtụ n'ime ha agabeghị akwụkwọ, mana ha na-ekwu na Naịjirịa bụ mba na-emeputa mmanụ, n'ihi ya, ha achọghị ime ihe ọbụla, mana ha chọrọ ịnweta ụlọ, nletaahụike na agụmakwụkwọ na-etufughi ego ọbụla."
2. Ọnọdụ nwunye m bụ n'usekwu
Ọtụtụ ndị mmadụ agaghị echefu oge Buhari kwuru na nwunye ya bụ Aisha enweghị ọnụ n'ime ihe na-eme n'otu pati APC.
O kwuru nke a oge ọ gara njem nleta na Germany n'afọ 2016.
O kwuru na "o nwere ọnụ naanị n'usekwu m, n'obi m na ọnụụlọ nke ọzọ"
Edemede a nwere ihe ndị si na Google YouTube. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Google YouTube iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of YouTube post, 1
3. Mpụ juru na Naịjirịa
Oge David Cameron bụ praịm minista ndị Britain n'afọ 2016, o kwuru na "mpụ na nrụrụaka juru na Naịjirịa nke ukwuu".
Ihe a kpasuru ndị Naịjirịa iwe, mana nke kacha wee ndị mmadụ iwe bụ na Buhari gwara ndị ntaakụkọ na o kwenyere n'ihe Cameron kwuru.
Edemede a nwere ihe ndị si na Google YouTube. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Google YouTube iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of YouTube post, 2

Akụkọ ndị ga-amasị gị:










