Chike Obi: Odogwu Igbo ji 'mathematics' rie amusu

Chike Obi

Ebe foto si, Math.buffalo.edu

Nkọwa foto, Chike Obi
    • Onye dere ya, Chukwunaeme Obiejesi
    • Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist, Igbo

Taa bụ abalị 13 nke ọnwa Maachị af ọ 2021 ka o mere ya afọ 13 Chike Obi, ọkamm̀ụta mgbakọ na mwepụ, lara mụọ.

Lee ịhe ụfọdụ dị mkpa e ji echeta nwa amadị ahụ riri amusu na 'Mathematics':

Ọ ga-ara ahụ ịhụ onye Igbo ọbụla na-anụbeghị maka Chike Obi

Ma na Naịjirịa ma na mba ụwa niile, aha Chike Obi na-ada ka mkpọnala oge ọbụla a kpọrọ ya.

N'ala Igbo, onye chọrọ igosi na ọ maka akwụkwọ, ndị mmadụ ga-ajụ ya sị "ị ma akwụkwọ karịa Chike Obi?"

Ihe e ji mara odogwu Igbo a bụ mgbakọ na mwepu nke Bekee kpọrọ 'mathematics'.

N'ụbọchị Fraịde, abalị iri na atọ nke ọnwa Maachị ka o mere afọ iri na abụọ dike Igbo a lara mmụọ.

Onye bụ Chike Obi

Chike Obi

Ebe foto si, Mathshistory.st-andrews.ac.uk

Nkọwa foto, Chike Obi

A mụrụ Chike Obi n'ọnwa Eprel afọ 1921.

Nna ya bụ onye Ọnịcha ebe nne ya bụ onye Asaba.

Chike Obi gụrụ akwụkwọ elementịrị na Zaria, dị na Kaduna steeti ugbua, n'afọ 1933.

Akwụkwọ Sekọndịrị ya bụ na CKC Ọnịcha nke ọ gụchara n'afọ 1939.

CKC

Ebe foto si, Facebook/CKC Old Boys Ass. Abuja

Nkọwa foto, Chike Obi gụrụ akwụkwọ na CKC nke ọnịcha

Ọ banyere 'Yaba Higher College' dị na Legọs n'afọ 1940

Ebe ahụ ka ọ nọrọ gụọ ma nwetakwa nzere B.Sc nakwa M.Sc na 'mathematics' nke Mahadum London n'afọ 1946 na 1947.

N'ọnwa Septemba afọ 1947, Obi banyere ụgbọmmiri gawa obodo Southampton nke mba Briten ịga gụọ akwụkwọ ineta nzere Ph.D.

O nwetara nke a n'afọ 1950

Nkuzi Chike Obi

Mathematics

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Chike Obi ji 'maths ata atụ ụtụtụ

Chike Obi nọrọ nwa obere oge n'ụlọakwụkwọ 'Massachusetts Institute of Technology' nke mba Amerịka.

Ọ kuziri na Mahadum Ibadan bido na 1959 ruo 1970, nakwa Mahadum Legọs bido 1971 ruo 1985.

O mechara mepee ụlọọrụ nnyocha a kpọrọ 'Nanna Institute for Scientific Studies' n'Ọnịcha.

Ụfọdụ na-ekwu na Chike Obi rụtara 'maths' a kpọrọ 'Fermat's last theorem'.

Mana ndị ọzọ na-ekwu na ọ rụtachaghị ya.

Ezinụlọ ya

Mustafa Chike-Obi

Ebe foto si, Twitter/@Mustafa Chike-Obi

Nkọwa foto, Mustafa Chike-Obi bụ nwa nke abụọ ọkammụta Chike Obi mụrụ.

Obi lụrụ nwunye ya bụ Belinda Nwanyife n'afọ 1953.

Ha mụrụ ụmụ anọ.

Iji gosi nkwenye ya n'ịdịnotu Naịjirịa, Chike Obi gụrụ ụmụ ya abụọ aha Yoruba na Hausa.

Nke nnukwu bụ Balogun ebe nke na-eso ya bụ Mustafa.

Mustafa gwara BBC Igbo na nna ya hụrụ Naịjirịa n'anya nke ukwuu.

Ndọrọndọrọ ọchịchị

Azikiwe

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Nnamdi Azikiwe hibere otu ndọrọndọrọ bụ National Council of Nigeria and Cameroon (NCNC) ebe Chike Obi hibere nke a kpọrọ 'Dynamic Party'. Otu abụọ a mechara jikọọ ọnụ.

Chike Obi so na ndị mbụ malitere ime ndọrọndọrọ ọchịchị na Naịjirịa.

N'afọ 1951 ka o bidoro otu ndọrọndọrọ a kpọrọ 'Dynamic Party'.

Otu a mechara sonyere otu NCNC nke Nnamdi Azikiwe bidoro.

Oge Naịjirịa nwere onwe ya n'afọ 1960, Obi bụ otu onye n'ụlọomeiwu nke mpaghara ọwụwa anyanwụ.

Ọtụtụ oge ka e jidere Chike Obi ma tụkpuo ya na mkpọrọ n'ihi mbọ ọ na-agba ịkwalite ọdịmma ndị Igbo.

Oge agha Bịafra malitere, Chike Obi na Odumegwu Ojukwu rụkọrọ ọrụ ruo mgbe agha biri.

Ọ bụ eziokwu na Chike Obi alaala mmụọ, mana ike ọ kpara ka na-ada ụda n'ụwa niile.

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ga-amasị gị:

Ihe nkiri ga-amasị gị:

Aha onyonyo, 'Onweghị ụzọ ọzọ e si enweta ego na-abụghị ịrụsị ọrụ ike'