Johnson Aguiyi-Ironsi: Ihe ị maghị maka odogwu a nwụrụ kemgbe afọ 55

- Onye dere ya, Chimamaka Ihenacho
- Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist, Igbo
Ị nụtụla maka dimkpa a kpọrọ Johnson Thomas Umunnakwe Aguiyi-Ironsi? Gịnị ka ị ma maka ya?
A kọwa akụkọ maka ọchịchị Naịjirịa ghara ịkpọta aha Aguiyi-Ironsi, mara na akụkọ ahụ ezughi ezu.
N'ihi na ọ bụ nwoke a bụ onye agha mbụ chịrị Naịjịria dịka ọchịagha, mgbe a chụpụrụ ọchịchị ndị ọcha nyefere ndị ọchịchị gụnyere Nnamdi Azikiwe, Tafawa Balewa nakwa Shamadu Bello, n'afọ 1966.
Site na mgbe a mụrụ ya ruo mgbe ọ nwụrụ, ọ kpagidere ike, ma gosi mmụọ ịkpa ike e ji mara ndị Igbo.

Ihe ị kwesịrị ịma maka Johnson Aguiyi-Ironsi
- A mụrụ ya n'ụbọchị atọ nke ọnwa Maachị afọ 1924
- Ọ bụ onye Ụmụana Ndume Ibeku dị n'Ụmụahịa, dị n'Abịa steeti
- Oge a mụrụ ya, naanị Thomas Umunnakwe ka ọ na-aza, mana ọ malitere ịzakwa Johnson mgbe ọ gara biri na nke nwanne ya nwaanyị nke di ya na-aza Johnson
- Ọ gara akwụkwọ n'Ụmụahịa, na Kano ma mechakwaa gaa na Camberley, dị n'Ịngland
- O sonyere ndịagha Naịjirịa ka ọ dị afọ 18
- Ka ọ banyechara, o si n'ọkwa "private" rigogide ruo mgbe ọ bụzị ọchịagha nke bụ "Major-General" na Bekee, n'afọ 1965
- N'ihi ọrụ o so ụfọdụ ndịagha ọzọ a họpụtara iso chekwaa Ezenwaannyị Elizabeth nke abụọ nke Briten rụọ mgbe ọ bịara Naịjirịa n'afọ 1956, e mechara mee ya "Member of the Royal Victorian Order (MVO)
- Ọ lụrụ nwunye ya bụ Victoria n'afọ 1953
- N'ụbọchị 17 nke ọnwa Jenụwarị 1966 ka ọ malitere ọchịchị mgbe Emmanuel Arinze Ifeajuna na Chukwuma Kaduna Nzeogwu napụrụ ndị ọchịchị nkịtị ahụ ọchịchị n'ike
- O bụ ya wepụtara iwu kpokọtara Naịjiria ọnụ ka ọ banyere ọchịchị, mgbe o wepụrụ ndị bụbu ndị isi mpaghara anọ gụnyere Ugwu, Ndịda, Owuwa na ndị Etiti
- Ọ nwụrụ n'ụbọchị 29 nke ọnwa Julaị afọ 1966, ka ndịagha gburu ya iji napụ ya ọchịchị n'ike ka ọ chịchara naanị ọnwa isii.

Ebe foto si, Getty Images
Njirimara ya
O nwere otu mkpara o ji akpa nganga a kpụrụ dịka agụiyi (bụ aha ya) ọ na-ejikarị agagharị.
Akụkọ ga-amasị gị:
Ihe nkiri a ga-amasị gị:










