Akanu Ibiam: Nwoke ọma zuru ụwa ọnụ

Akanu Ibiam
    • Onye dere ya, Chimamaka Ihenacho
    • Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist, Igbo

Aha ya dị n'ọdọụgbọelu, dịrị n'okporoụzọ nakwa ebe ndị ọzọ, mana onye ka Maazị Akanu Ibiam bụ?

Ọtụtụ ndị ahụla aha nwoke a ma n'ụlọakwụkwọ nakwa ebe ndị ọzọ, mana ha amaghị maka nwoke a so n'otu okeosisi ndị Igbo.

A bịa n'ala Igbo kpọọ aha ndị tozuru etozu mgbe gboo ghara ịgụnye ya n'ime mmadụ iri mbụ a kpọpụtara, mara na a gụwabeghi.

Makana taa bụ ụbọchị 29 nke ọnwa Nọvemba 2019 gaara abụ ụbọchị ncheta ọmụmụ ya maọbụrụ na ọ ka dị ndụ, BBC Igbo ga-akọwara gị ihe ị kwesịrị ịma maka ya.

Akanu-Ibiam Airport Enugwu
Nkọwa foto, Akanu Ibiam Airport Enugwu

Ihe ị kwesịrị ịma maka Akanu Ibiam

  • A mụrụ ya n'obodo Unwana dị n'Afikpo dị n'Ebọnyi steeti n'ụbọchị 29 nke ọnwa Nọvemba, afọ 1906
  • Ọ gara akwụkwọ sekọndrị na Hope Waddell Training Institute ebe ya na ndị dị ka Nnamdi Azikiwe, Alvan Ikoku, Eni Njoku nakwa ndị ọzọ gara akwụkwọ.
  • Ọ gakwara Kings College tupu ọ gaa gụọ maka Ahụike na University of St.Andrews dị na mba Skọtlandị
  • Ọ bụbu gọvanọ ebe a ma dịka "Eastern Region"
  • O mechara bụrụ onyeisi ụlọakwụkwọ Hope Waddell ahụ, n'afọ 1957, ruo afọ 1959 oge e mere ya onyeisi mahadum Ibadan
  • Oge ọ dị ndụ, ọ katara ụka ọfụma, mere e ji mara ya amara ma n'ụka Church of Scotland. O nwetakwara ọkwa n'ọgbakọ ndị ụka na Naịjirịa
  • O nwetara nturuugo Order of the British Empire
  • O si na ihe gbasara agụmakwụkwọ banye ndọrọndọrọ ọchịchị bụ ihe e ji anụ aha ya ugbua
  • Ọ rụrụ dịka onye ọchịchị ime obodo, n'ụlọomeiwu nke mpaghara ọwụwa-anyanwụ
  • Ka Naịjiria nwetara nnwereonwe n'aka ndị mba Briten n'afọ 1960, e mere ya gọvanọ na-achị mpaghara ọwụwa-anyanwụ bụ ebe ọ nọ ruo afọ 1966 mgbe ndịagha ji ike weghara ọchịchị, mere ka Chukwuemeka Odumegwu Ojukwu bụ onye agha Naịjiria mgbe ahụ chụpụ ya n'oche ọchịchị
  • Ibiam nyerela ndị Biafra aka dị egwu mgbe a na-alụ agha; site n'isi n'aka ndị ọ ma n'ụka na-ewetara ha ihe enyemaka n'ime abalị
  • O ji maka enyemaka ndị Briten na-enyere ndị Naịjiria n'agha ahụ kwuo sị na ọ gaghị azazị agha Bekee ya bụ 'Francis'
  • Ọ nwụrụ n'ụbọchị mbụ nke ọnwa Julaị n'afọ 1995, mgbe ọ dị afọ 88
  • A gụrụ ọdọụgbọelu dị n'Enugwu steeti aha ya, ụzọ dị n'Ụmụahịa nakwa n'Ebọnyị, mahadum dị n'Ebọnyị bụ ebe o si, nakwa ọgbọegwuregwu dị n'ime mahadum Nsụka.
Mahadum Akanu Ibiam

Ebe foto si, Facebook/Akanu Ibiam Polytechnic

Akụkọ ga-amasị gị:

Ihe nkiri a ga-amasị gị:

Aha onyonyo, Killiwee Nwachukwu