Chinua Achebe: Etu o si debanye aha ya n'obi ndị Naịjirịa

Ebe foto si, Getty Images
- Onye dere ya, Chimamaka Ihenacho
- Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist, Igbo
- Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2
Ọ bụrụ na Chinualumogu Albert Achebe dị ndụ, ọ gaara adị afọ 89 ugbua.
Ị bụrụ onye Igbo maọbụ onye Naịjiria ma ị nụbeghị, hụ maọbụ gụọ akwụkwọ o dere bụ 'Things Fall Apart', gbara ọsọ gaa weghachị akwụkwọ ikike na-egosi na ị bụ onye Naịjirịa.
Achebe nwụrụ n'n'ụbọchị 21 nke ọnwa Maachị afọ 2013 oge ọ dị afọ 82, bụ otu onye ndị Igbo na akụkọ Igbo agaghị echefu echefu ma ọlị, ọkachasị maka ụdịrị mbọ ọ gbara oge agha Biafra.
Ọ bụ maka akụkọ ndị o dere maka agha Bịafra, ka ọ bụ maka akụkọ mmụta gbasara nkuzi ihe na-eme n'ala Igbo nakwa Naịjiria? Achebe ejighi ụjọ biri.

Ebe foto si, AFP
Mgbe ọ dị ndụ, Achebe a ma ama na mpaghara mbaụwa, a na-akpọ "mpa ide akụkọ Afrịka n'ụzọ ọgbara ọhụrụ", dere akwụkwọ karịrị iri nakwa ọtụtụ mbem.
Achebe ji akpa kpokọọ nturuugo karịrị iri atọ na mahadum dị iche iche dị na mbaụwa.
Ngwa lee ihe ị kwesịrị ịma maka ya:
- A mụrụ ya n'Ogidi dị n'Anambara steeti n'ụbọchị 16 nke ọnwa Nọvemba afọ 1930.
- Ọ nọbu na-agụ maka Ahụike na mahadum Ibadan ka e nyere ya ohere ịga akwụkwọ n'efu, mana ọ gbaghapụrụ ya gaa gụọ Bekee, Akụkọ mgbe gboo na Nkammụta ofufe.
- Ọ lụrụ nwunye ya bụ Christie Okoli bụ onye o zutere n'ụlọọrụ ya, n'afọ 1961. Ha mụrụ ụmụ anọ.
- O si n'aka nne ya na nwanne ya nwaanyị mụta etu e si akọ akụkọ.
- Ọ bụ onye nkuzi, ode mbem, ode akwụkwọ nakwa onye ntaakụkọ nke BBC kuziiri.
- Akwụkwọ ndị e ji mara ya gụnyere 'Things Fall Apart, Chike And The River, No Longer At Ease, Arrow Of God, A Man Of The People, Anthills Of The Savannah, There Was A Country, dgz.
- O so malite ụlọọrụ ntaakụkọ a ma ugbua dịka 'Voice Of Nigeria (VON).
- Oge agha Biafra, o mere ka ọha mara na o jighi Biafra egwu egwu; ya na ụfọdụ ndị enyi ya na-abụghị ndị Igbo sere ezigbo okwu maka ihe gbasara ya.
- N'afọ 1990, ọ dabanyere n'ihe mberede okporoụzọ mee ka o nwetu obere mkpọnwụ ahụ ma tinye ya n'oche e ji ebu ndị ọrịa.
- Oge ọ gaara adị afọ 87, ụlọorụ Google sere ya ka ụwa niile mara ya ma ha na-achọ ihe n'elu intanetị

Ebe foto si, Getty Images
Lee ndị Igbo ọzọ na-ede akwụkwọ ka Achebe:
Akụkọ ga-amasị gị:
Ihe nkiri ga-amasị gị:










