Nigerian Celebrities: Ndị a ma ama ụzụ tụrụ n'isi ha n'izu a

Ebe foto si, Burna/Davido/Sylvia/Instagram
Igbo na-atụ ilu sị na "ọ bụrụ na mmadụ ekoteghI, ọgọdọ ya ekotere ya".
Nke a bụ etu ọ dị ụfọdụ ndị a ma ama dịka ụzụ tụrụ n'isi ha n'izu a, n'ihi otu ihe maọbụ nke ọzọ, nke ha kpatara n'aka ha nakwa nke ndị onye ọzọ kpatara ha.
Ngwa ka anyị tụlee ụfọdụ ndị a nakwa ihe mere aha ha ji daa ụda n'izu a.
Burna Boy

Ebe foto si, Burnaboy/instagram
Burna Boy bụ nwokoroọbịa a ma ama n'iti egwu, ụfọdụ na-akpọ ya 'African giant' n'ihi nturuugo o riterela n'iti egwu.
Ihe mere na aha Burna Boy ji daa ụda n'izu a bụ maka na ọ sị na ọ ga-aga mba Saụt Afrịka gaa tie egwu n'emume a kpọrọ 'Africanunite'.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Nke a mere ka otu onye otiegwu na Saụt Afrịka a kpọrọ AKA ji sị ka Burna Boy rịọ ndị mba ha mgbaghara tupu ọ na-ama ụkwụ na Saụt Afrịka.
AKA sị na ọ bụ maka ihe Burna Boy kwuru oge ndị Saụt Afrịka na-awakpo ndị Naịjirịa na ndị mba Afrịka ọzọ bi n'obodo ha.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
Nke mere ọtụtụ ndị mmadụ ji kpụrụ aha Burna Boy n'ọnụ na soshal midia n'ụbọchị 14 Nọvemba, 2019.
Davido

Ebe foto si, Davido/instagram
David Adeleke bụ onye e ji Davido mara na-etikwa egwu ndị a na-anụ ụda ha na Naịjirịa, Afrịka nakwa mba ụwa gbagburugburu.
O gụrụ nwa nwoke ọ mụrụ ọhụrụ aha na Lọndọn, o kpọrọ aha ya 'David Adedeji Ifeanyichukwu Adeleke Jnr'.
Edemede a nwere ihe ndị si na Instagram. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Instagram iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of Instagram post, 1
Ihe ọzọ mere aha Davido ji tụọ ụzụ n'izu a bụ foto o gosiri ebe ọ zụnyere ndị otu ya ihe, nke mere ndị mmadụ ji etu ya "ome ọgọ nke mbụ".
Edemede a nwere ihe ndị si na Instagram. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Instagram iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of Instagram post, 2
Sylva Ukaatu bụ onye na-eme ejije kwuru ihe mere ọtụtụ ndị mmadụ kachasị ụmụnwaanyị ji kpụrụ ya n'ọnụ n'izu a.
Ọ sị na ụmụnnwaanyị ezughi ezu maọbụrụ na nwoke anọghị ha n'akụkụ, ya mere ka nwagbọghọ gbalịa lụọ di ọ bụrụgodi ịbụ nwunye nke atọ.
Edemede a nwere ihe ndị si na Instagram. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Instagram iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of Instagram post, 3
Enyinnaya Abaribe

Sịnetọ Enyinnaya Abaribe bụ onye na-anọchiteanya Abia South n'ụlọomeiwu kwuru okwu dara ụka n'izu a mgbe o tinyere ọnụ n'iwu ọhụrụ a chọrọ ime maka okwu ịkpọasị na Naịjirịa.
Iwu a sị na a ga-akwụ onye ọ bụla kwuru okwu ịkpọasị ụdọ. Mana Abaribe sị na ọ bụrụ na iwu dị kamgbe 2012 na Lai Mohammed ọ gara adị ndụ ugbua?
Nke a mere ọtụtụ ndị mmadụ ji kpụrụ aha Enyinnaya Abaribe n'ọnụ.
Hilda Dokubo

Ebe foto si, Hilda Dokubo Instagram
Hilda Dokubo bụ nwaanyị malitere ime ihe nkiri mgbe gboo pụtakwara ihe taa n'ihi mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere.
Hilda tinyere ọnụ n'okwu banyere ihe ọ na-eme ugbua, mwereonwe Biafra nakwa ihe ndị ọzọ.
Content is not available
View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.sEnd of Facebook post
Akụkọ ndị ga-amasị gị:










