Eni Njoku: Gịnị ka ị ma maka nwoke a isi ya na-apụ ọkụ n'agụmakwụkwọ?

Ebe foto si, Unilagalumniassociation
- Onye dere ya, Chimamaka Ihenacho
- Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist, Igbo
Eni Njoku bụ otu dimkpa Igbo e ji ama atụ onye gbajiri "chalk" ma kụwaa "slate".
Dimkpa Igbo a bu agụmakwụkwọ n'isi ọ fọzịa obere ka o si ya n'imi na ọnụ na-apụta.
Maka ihe ọ gụtara n'akwụkwọ, ọ bụzị onye a na-anụ aha ya na mpaghara Naịjirịa, nke bụ na aha ya dị n'ụfọdụ okporoụzọ nakwa ụlọakwụkwọ.
A gụrụ otu ụlọobibi dị na mahadum Legọs aha ya, e nwere ụzọ dị n'Owere, Imo steeti a gụkwara aha ya ma dgz.
Ma ruo ugbua, a ka na-eme emume ncheta ọmụmụ ya kwa afọ nke a kpọrọ "memorial lectures" na Bekee.
Gịnị ka ị kwesịrị ịma maka ya?
- Ọ bụrụ na ọ dị ndụ ugbua, Njoku bụ onye a mụrụ n'ụbọchị isii nke ọnwa Nọvemba 1917 gaara adị afọ 102.
- Ọ bụ onye Ebem nke Ọhafịa dị n'Abịa steeti.
- Ọ lụrụ Winifred Oliver Beardsall, onye ọcha mụtaara ya nwa ya nwoke bụ Eni Njoku Jr na-arụ ọrụ dịka ọkammụta sayensị na-eme nyocha na mba Amerịka.
- Ọ gara ụlọakwụkwọ sekọndịrị na Hope Waddell Training Institute; ndị dị ka Nnamdi Azikiwe, Akanu Ibiam, Alvan Ikoku nakwa Dennis Osadebay gakwara ụlọakwụkwọ a.
- Ọ gụrụ mahadum n'ebe a ma ugbua dịka Yabatech dị na Legọs, University of Manchester nke dị n'Ịngland, nakwa University of London.
- Ọ gụrụ "Botany", nke bụ maka mmụta maka osisi (study of plants).
- O mechara kuzie nkuzi na mahadum Ibadan nakwa mahadum Michigan steeti dị na mba Amerịka.
- Njoku bụ onyeisi ojii mbụ nọ dịka onyeisi mahadum Legọs, nke ọ nọ site afọ 1962 ruo 1965
- Ọ nọ dịka onyeisi Mahadum Naịjirịa dị na Nsụka site n'ọnwa Julaị 1966 ruo 1967 ma nke ugboro abụọ site 1967 ruo 1970.
- Ọ bụkwa odee derela ihe ndị gbara n'akwụkwọozi ndị mba ofesi.
Akụkọ ga-amasị gị
Ihe nkiri ga-amasị gị:










