Pete Edochie ama eme ejije?

Pete Edochie

Ebe foto si, Yuledochie

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Ndị mmadụ na-adọrịta ụka na soshal midia maka ihe otu nwagbọghọ kpọrọ onwe ya Sugabelly kwuru sị na "Pete Edochie amaghị ka esi eme ejije".

Sugabelly sị na Pete Edochie na-eme naanị otu ụdị ihe nkiri kamgbe ọ malitere ime ejije; na ihe nkiri "abụghị naanị ịtụ ilu".

Aha onyonyo, Pete Edochie gọrọ BBC Igbo ọjị
Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

Okwu ya a gbarụrụ ihu otụtụ mmadụ bụ ndị sị na ọ bụ mkparị ka nwagbọghọ a kparịrị 'odogwu n'ihe nkiri' bụ Pete Edochie.

@EdoFirstLady sị na ọ bụghị ihe ịtụnanya na ndị mmadụ na-atụnyere mmadụ na ibe ya dịka mgbe a sịrị na Beyonce ka Michael Jackson mma n'iti egwu.

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

@Adunni_Achebe sị na Pete Edochie na-emekarị ihe nkiri ebe ọ bụ Eze apụtaghị na ọ maghị eme ejije.

Skip X post, 3
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 3

Ụfọdụ ndị kwenyere n'ihe Sugabelly kwuru;

@lollypeezle sị Pete Edochie metụkwanụ ụdịrị ihe nkiri ọzọ, na ọ bụghị oke ihe ka a na-achọ n'aka ya.

Skip X post, 4
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 4

Dịka ịrụrịtaụka na-aga n'ihu, ka anyị lebanye anya na njem Pete Edochie n'ime ihe nkiri;

Ndụ Pete Edochie na njem ime ihe nkiri ya:

  • A mụrụ Peter Edochie n'ụbọchị asaa nke ọnwa Maachị afọ 1947 n'Enugwu Steeti.
  • Ọ na-eme ihe nkiri ma bụrụkwa onye na-agbasa ozi.
  • Ọ malitere ọrụ mgbasaozi ya n'afọ 1967 n'ụlọọrụ Eastern Nigerian Broadcasting Corporation.
  • Ọ na-atara ọzụzụ n'aka ụlọọrụ British Broadcasting Corporation (BBC) na mgbasaozi n'afọ 1980.
  • Ọ pụtara ihe n'ime ihe nkiri n'etiti afọ 1980 na 1990 mgbe o sonyere n'ihe nkiri 'Things Fall Apart' ebe a kpọrọ ya 'Okonkwo'.
  • Pete Edochie emeela ihe nkiri karịrị 100 ndị gụnyere Igodo, Narrow Escape, End of Money, Oracle na nke nso nso a bụ Lionheart.
  • O ritela ihe nturuugo n'ime nkiri dịka 'Industry Merit Award, Lifetime Achievememt Award'.
  • N'afọ 2003, gọọmentị Naịjirịa nyere Pete Edochie nkwanye ugwu 'Member of the order of the Niger (MON)'.

Ọtụtụ ndị mmadụ na-ahụ Pete Edochie dịka otu n'ime ndị kachasị eme ihe nkiri n'Afrịka.

Anaghị agụ aha ndị na-emete ọnụ ha n'ejije na Naịjiria nakwa Afrịka ghara ịkpọ aha ya.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: