Odumegwu Ojukwu: Obi adịghị ndị Igbo mma n'ọnọdụ ha nọ na Naịjirịa

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4

Akụkọ dị mkpa

Obi adịghị ndị Igbo mma nọ n'ọnọdụ ha - Ike Ekweremadu

Ekweremadu

Ebe foto si, Ike Ekweremadu

Nkọwa foto, Ekweremadu, nwụnye ya na nwa ya nọ n'ụlo ya mgbe ndị a ji egbe bata

Onye bụbu osote onyeisi ndị Sịnetị bụ Ike Ekweremadu sị na obi adịghị ndị Igbo n'ime ọnọdụ ha nọ na Naịjirịa, na e nwere ọtụtụ ihe kpatara nke a.

O kwuru nke a n'ọgbakọ ọmụmụ ihe nke ncheta ọnwụ Chukwuemeka Odumegwu Ojukwu n'ụbọchị anọ nke Nọvemba, 2019 na Mahadum Ojukwu dị n'Anambra Steeti.

Ekweremadu bụ onyeisioche ọgbakọ a sị na ọ bụ ezughi oke dị n'obodo Naịjirịa butere mkpasu iwe niile a.

Ọ sị na o kwenyere na ndị Igbo ga-egosipụta ike ha n'uju maọbụrụ na a hazigharịa Naịjirịa.

N'aka nke ọzọ onye zọburu ọkwa onyeisiala n'aha pati Young Progressive Party bụ Kingsley Moghalu sị ka Yakubu Gowon bụbu onyeisiala Naịjirịa ka o kwuo eziokwu maka ogbugbu e gburu ndị Igbo n'oge agha.

Ọ sị na ọ bụ ihe ọjọọ ka Naịjirịa soro na-eme emume ncheta ogbugbu ndị mmadụ na Rwanda ebe e mere nke ka njọ na Naịjirịa na-ekwupụtaghị ya.

Bianca Ojukwu ekwuola obi ya

Bianca Ojukwu

Ebe foto si, Bianca Ojukwu/ facebook

Nkọwa foto, Bianca Ojukwu bụ onye meriri n'asọmpị 'nwaanyị kachasị maa mma' na Naịjirịa nke afọ 1988

"Obiano, ihe ncheta Ojukwu hapuru anyị na-anwụ n'ihu gi?"

Nke a bụ okwu Bianca, nwunye Odumegwu Ojukwu kwuru n'emume ncheta Dikeogu bụ Dim Chukwuemeka Odumegwu Ojukwu n'Awka.

O kwuru na gọvanọ steeti ahụ anaghị etinye anya na mkpụrụ Ojukwu kụrụ maka ndị Igbo.

Bianca, onye bụbu onye nnọchite anya Naịjirịa na mba Spen, bere akwa a na ya bụ ọgbakọ emere na Igbariam, Anambra steeti.

O kwuru na All Progressives Grand Alliance (APGA) bụ pati nko Ojukwu hibere sọ na ya bụ ntọala.

Bianca kwara arịrị na Gọvanọ Obianọ abịaghị ya bụ emume dịka ọ mere na nke mbụ.

Ọ gwara osote gọvanọ steeti ahụ bụ onye nọchitere anya gọvanọ ahụ ya zie ya na "ọtụtụ ntọala Ezeigbo hibere na-anwụ n'ihu ya".

"Zie ya na enweghị ajọọ mmụọ nọ ebe a".

Bianca bokwara Obiano ebubo ịgbahapụ ndị niile nyeere ya aka ịrigote n'ọkwa gọvanọ.

O kwukwara na ọ dịka ka akpachapụru anya ịbịachi ahụhụ a tara n'agha Biafra nke ga-enyere ndị mmadụ aka ịmata ebe ha na-aga.

Anambra na Delta kee nkwụcha maka idemmiri

Ọdọmmiri Dam

Ebe foto si, Reuters

Edo, Anambra, Delta, Bayelsa na Rivers steeti keenụ nkwụcha maka idemmiri na-abịanụ?

Nigerian Hydrological Service Agency (NHSA) na-adọ steeti ndị a aka na ntị ka ha kwado onwe ha maka idemmiri na-abịa.

Anyị nụrụ na gọọmenti Cameroon sị na ha ga-emeghepụ ụzọ ọdọmmiri Dam ha iji mee ka mmiri putu na ya.

Onyeisi ụlọọrụ NHSA bụ Clement Nze kwuru na ndị gọọmentị Cameroon agbaghị ya bụ ama n'oge agbanyeghị ụgboro ole maọbụ ole ndị Naịjirịa degagoro ha akwụkwọ.

Nze sị ya bụ ntọhapụ ndị Cameroon tọhapụrụ ya bụ ọdọmiri mere idemmiri ji dị n'Adamawa, Taraba, Benue na Kogi steeti.

Nke a mere ha ji agbara ndị Kogi, Edo, Delta, Rivers, Bayelsa, Anambra ama ka ha kee nkwucha.

Okwuru na idemmiri ga-esi na steeti ndị a gafee tupu ọbanyekwa na Oshimiri nke Atlantic.

Tunyenu Stella Adadevoh ugo

Stella Adadevoh
Nkọwa foto, Stella Adadevoh

Ndị ụlọomeiwu nta agwala gọọmentị etiti ka ha tunye Stella Adadevoh ugo pụrụ iche n'ihi ike ọ kpara iji kwụsị mgbasa ọrịa ebola na Naịjirịa.

Ha kwuru nke a n'ọgbakọ ha n'ụbọchị Tuzde.

Ha dọkwara aka na ntị ka a gbaa mbọ hụ na e mere ihe niile iji gbochie ọrịa ọjọọ ahụ ịbata obodo Naịjirịa ọzọ.

Amerika sị na ha ga-apụ na nzụkọ mbara enigwe

Alaọkpọnkụ

Ebe foto si, Reuters

Ụmụibe Amerika ekwuputala mmasị ha ịpụ n'otu UN na-ahụ maka ọdịmma mbara enigwe.

Nke a bụ nzọ ukwu nke mbụ ha n'usoro isepụ aka na ya bụ nkata mba ụwa na-akpa maka ọdịmma mbara enigwe.

O teelarị aka onyeisiala Donald Trump ji kwuwe na Amerịka ga-esepụaka na nkwekọrịta 'climate change', mana ugbua ka ya bụ ije iji sepụ aka na ya malitere n'uju.

Tanker ọzọ adaala n'Imo steeti

Ọ dịka Tanka ọzo bụ mmanụ ụgbọla adaala n'ụzọ sitere Nkwọ Umụezeala, nke dị na Mbanọ , Imo steeti.

Ihe onyonyo na-egosi bebe ndị mmadu ji mmiri ncha azachapụ mmanụ ụgbọala ka ọ hara ịnwuru ọkụ.

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post

Lionheart apụọla n'Oscar

Lionheart

Ebe foto si, Getty Images

Igbo bụ Igbo nke na-akpọtụ ugbua bụ na-ewepụla Lionheart nke Genevive Nnaji dịka ihe nkiri ga-anọchite anya Naịjirịa n'Oscar.

Ndị na-ekpokoba ya bụ ihe sị na-ejighị asụsụ Naịjirịa mee ya.

Pinnick Alaferela

Amaju Pinnick

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Amaju Pinnick bụ onyeisiala NFF

Gọọmentị etiti akụchapụla akwụkwọ ha gbara Amaju Pinnick bụ onyeisi otu na-achịkọta egwuregwu bọọlụ na Naịjirịa a kpọrọ NFF.

E boro Pinnick ebubo na o zuru ego ruru nde naịra anọ dịka onyeisi NFF, mana ugbua ụlọikpe asịla ya lawa na ikpe amaghị ya.

Gee akụkọ ndị a na nkeji:

Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Akụkọ ga-amasị gị

Ihe nkiri ga-amasị gị:

Aha onyonyo, Solomon Ukoha onye nrụputa akụrụmgwa