Nne ụmụaka atọ ụlọ aja dagburu n'Ebonyi amabeghị na ha nwụrụ
Ụlọ Mazi Sunday Okereke na ezinaụlọ ya bị n'obodo Akaeze dị n'Ebonyi steeti bụ nke dagburu ụmụ ya atọ n'ụbọchị mbụ nke ọnwa Nọvemba a ka nnukwu mmiri zochara.
Ndị ezịnaụlọ Okereke nakwa ndị Akaeze niile ji anya mmiri were kwuo na ụdịrị ọdachi ahụ emebegh na be ha mbụ.

Sunday Okereke kọwara BBC na ya gara ikiri egwuregwu bọlụ ụbọchị ahụ, nke mere na nwunye ya na ụmụ ya anọ na arahụ ụra oge ya bụ mkpamkpa kpara.
Sunday ji anya mmiri kwuo na ngwa ngwa mmiri zochara ka akpọrọ ya na ekwentị sị ya gbata ọsọ na ụlọ ya adaala.
Mgbe o rutara, ọ hụrụ ozu ụmụ ya atọ, ebe nwunye ya na dị ọkpara ya ka dị ndụ ma nọrọ n'ụlọ ọgwụ.

Nwanne Maazị Okereke bụ Emmanuel Okereke ma bụrụkwa di ọkpara ha na ezinaụlọ ahụ yọrọ ka agbatara ha mkpu enyemaka n'ihi na nwunye nwanne ya nwa ya nwoke pụtara n'ụlọ dara ada ka nọ n'ụlọ ọgwụ.
Emmanuel okereke kwuru na ihe kpatara ya bụ ụlọ jiri daa bụ n'ihi na ọ bụ ụlọ aja.
Eze na-achị Akaeze bụ Ezeogo Joseph Onu kwuru na ndị obodo ya akpala ka ha ga-esi dota ezinaụlọ ahụ ebe ha ga-ebi ganye na ha arụọ ụlọ ọzọ.
BBC Igbo gara na ụlọ ọgwụ akpọrọ Health Messenger nke dị na Akaeze junction ebe nne ụmụ aka ahụ bụ Elizabeth Okereke na di okpara ya nke dị ndụ na anara ọgwụgwọ.

Elizabeth enweghi ike ikwu okwu nke ọma mana nne ya kelere chukwu na agbanyeghị na ụmụ ụmụ ya atọ nwụrụ mana nwa ya nwaanyị ka dị ndụ tata.
Akụkọ ga-amasị gị:










