Igbo Marriage: Mgbe nwoke kwesiri ikuchi nwaanyị

Ebe foto si, Getty Images
Ndị Igbo anaghị eji alụm dị na nwunye na ụmụaka egwu egwu ọkachasị nwa nwoke.
Nganga nwoke mgbe ochie bụ ọba ji ya na etu ezinụlọ ya si jupụta n'ụmụaka.
Nwoke mụbara amụba na-ahụ onwe ya dịka nwoke zuru oke.
Agbụrụ mmadụ bụkwa ihe ọzọ dị ndị Igbo mkpa.
Onweghị onye chọrọ ka ama nna ya chie nke mere na nwoke ga-agbalị lụọ nwaanyị ma kpewere chi ya ka ọ mụọ nwa nwoke.
Nke a mere e ji atụ ilu sị na onye nwere mmadụ ka onye nwere ego.
Kedu mgbe nwoke ga-ekuchi nwanyị?
Duke Olueze Ukeje, nwaafọ Nwangele nke dị n'Imo steeti, kọwaara BBC ihe bụ ikuchi nwaanyị.
O kwuru sị na mgbe dị nwaanyị nwụrụ, ma ha amụtara nwa ma ha amụtaghị nwa, a na-ajụ nwaanyị ahụ ma ọ chọro ị nọ ka ọ chọrọ ịla be nna ya.
Ọtụtụ mgbe, nwaanyị ahụ na-ekweta na ọ ga-anọ na be dị ya.
Mgbe ọ dị otu a, ọ bụ nwanne di ya ga-ekuchi ya.
Otu ihe ọzọ dịkwa mkpa bụ na nwoke agaghị ekuchi nwunye nwanne ya nke ọ tọrọ.
Ọ bụ nwanne ha nke nta ga-ekuchi nwunye nwanne ya.
Mana gịnị ka a ga-eme ma ọ bụrụ na onye nwụrụ anwụ enweghị nwanne nwoke ọ tọtara?
Dịka Ukeje si kwuo, mgbe ihe dapụtara otụ a, ọ bụrụ na ọpara amụtabeghị nwoke topụtara etopu, ọ diziiri ya ikuchi nwunye nwanne ya.
Mana ọ bụrụ na ọmụtala nwoke topụtara etopu, mara na ọ bụ nwa ya ahụ ga-ekuchi nwunye onye nwụrụ anwụ.
Kama ọ bụrụ na-enweghịzị nwoke fọrọ n'ezinụlo ha, nwanna ha bụ otu agbụrụ ga-ekuchị nwaanyị ahụ.
Kedu onye ụmụ amụtara site na-ikuchi nwaanyị ga aza aha ya?
Ukeje gwara BBC Igbo na ọ bụ aha nwoke nke nwụrụ anwụ ka ụmụ amụtara site n'ikuchi nwaanyị ga-aza.
Nwanne nwoke onye ahụ nwụrụ anwụ ga-ewere mmanya gaa na nke ndi ọgọ ya gwa ha na-ọbụ ya ga-elekọta nwa ha nwaanyị.
Ụmụ amụtara ga-azazị aha nwoke nke nwụrụ anwụ.
Mana nwanne ya nwoke nwere ịke ịga lụgharịa nwunye nwanne ya ahụ.
Ọ bụrụ na nke a mee, ụmụ ha mụtara ga-aza aha ya.
Kedu ebe ụmụ amụtara na-ikuchi nwaanyị ga-ekete ọke?
Ụmụ nwoke onye nwụrụ anwụ ga-ekete oke n'ụlọ nna ha nwụrụ anwụ.
Kama ndị nke amụtara site na ikuchi nwaanyị ga-aza aha onye kuchịrị nne ha ma kete oke n'ama onye kuchiri nne ha.
Ọ bụrụ kwanụ nwoke lụrụ ọtụtụ nwunye?
Mgbe nwoke lụrụ ọtụtụ nwaanyị nwụrụ, ọpara ya ga alụwa ma kuchie nwaanyị ikpeazụ nna ya lụrụ.
Kedu maka ụgbụ a?
Ọkammụta n'ihe gbasara omenala Igbo bụ Gladys Udechukwu gwara BBC na mgbe ochie, ndị Igbo hụrụ ụmụaka n'anya ọkachasị nwa nwoke.
O kwuru na ụgbua, onye na amụtaghị nwa nwoke ma ọ bụ na-amụtaghị nwa ọbụla nwere ike ịga kute nwa n'aka gọọmentị.
Nke a bụ nke Bekee na-akpọ 'adoption'.
Udechukwu kọwakwara na e nwere atụmatụ sayensị dị na nwunye nwere ike iji mụta nwa nwoke.
O kwukwara na ọtụtụ ụmụnwaanyị gụrụ akwụkwọ agaghị ekwe ka nwanne dị ha kwuchie ha.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:
Ihe nkiri ga-amasị gị:












