Operation Positive Identification: Gbachịnụ ndị asịrị nkịtị - Ndịagha Naịjirịa

Ebe foto si, Nigeria Army
Ndịagha Naịjirịa ekwuola na onweghị ihe egwu ọbụla dị na atụmatụ nchekwa ha malitere bụ nke a kpọrọ 'Operation Positive Identification'.
Nke a na-abịa dịka akụkọ na-efegharị gbasara ya bụ atụmatụ.
Ha kwuru ka ndị mmadụ ghara ịṅa ntị n'asịrị nke na-efegharị nke na-ekwu na ndị agha na-akwado imekpa ndị ọha obodo ahụ.
N'akara 'Twitter' ha ka ha si zipụta ozi a n'ụbọchị Satọdee.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Ha kọwara na 'Operation Positive Identification' bụ iji kwadoo 'Operation Lafiya Dole' nke na-aga n'ihu na mpaghara ugwu.
Mmechi 'Border'

Ngalaba na-ahụ maka ntụbata ahịa na Naịjirịa bụ 'Nigeria Customs Service' na-ekwu na ha anwụchiela ngwaahịa ọnụ ego ya karịrị tarị naịra abụọ na ụma bụ nke ndị mmadụ chọrọ iji azụ ụlọ bubata na Naịjirịa kamgbe e mechiri border.
Onye kwuru nke a bụ Joseph Attah bụ ọnụ na-ekwuru ngalaba ahụ mgbe onye ntaakụkọ 'Punch' gbara ya ajụjụ ọnụ.
Atta kwuru na ngwaahịa ha nwụchiri gunyere mmanụ petrol, akpa osikapa, ụgbọala, ọgwụ ike, egbe, mgbọ egbe na ihe ndị ọzọ dị icheiche.
Cheta na Naịjirịa mechiri oke ala ya na mba ndị gbara ya gburugburu n'ọnwa Ọgọst 2019.
Onyeisiala Muhammadu Buhari kwuru na nke ahụ bụ iji gbochie mbubata ahịa n'ụzọ ezighi ezi.
Otu onye nwụrụ n'ime ụlọ dara na Legọs

Onyeisis ndị ọrụ gbata gbata na Legọs steeti bụ Dọkinta Oke-Osanyintolu sị na otu onye n'ime mmadụ ise ụlọ dachiri n'Ikoyi dị na Legọs nwụrụ anwụ tupu a gụpụta ya.
Mmadụ anọ ndị ọzọ merụrụ ahụ nọzị anata ọgwụgwọ ugbua.
Dọkinta Dr Oke-Osanyintolu sị na nyocha izizi ha gosiri na ọ bụ ngwa ọrụ adigboroja na ndị ọrụ amaghị arụ butere ọdịda ụlọ a, m kwukwa na ha ka ga-eme nyocha ịmata nke bu eziokwu.

Ọ si na ndị ọrụ ya bụ ndị ogige ha bụ "Lagos State Emergency Agency" (LASEMA n'ịchafụ) ga-alaghachite ebe ọdachị a dara ịga hụ na ya bụ ụlọ abụghịzị ihe ga-etinye ọha na nsogbu.
Dịka ndị na-arụ ọrụ n'ụlọ a nwụrụ siri gwa BBC, onye nwụrụ dina n'ime ya bu ụlọ ararụ ụra maka ahụ adịghị ya mgbe ọdachị a dara.
Ndị ọrụ gbata gbata amalitela ịkụtụ ụlọ ọzọ na nso ebe nke a dara dị, dịka onye ntaakụkọ BBC hụrụ ya siri kwuo.


Ntụlịaka Bayelsa na Kogi Steeti

Ebe foto si, AFP
Onyeisioche ndị INEC bụ Mahmood Yakubu etiela mkpụ na enwere ike inwe nnụkwụ ogbaaghara na ntụliaka a ga-eme na Kogi na Bayelsa steeti maka ndị omekome na akwado ibute ọgbaaghara.
Yakubu kwuru na oruola onwa asaa ha bidoro ikwado maka ntụliaka a ma sị na ha agaghị ekwe ka enwe ihe ọdachi ọbụla.
Kama onyeisi ndị uweojii na Naijirịa bụ Abubakar Mohammed Adamu gwara Yakubu na ha dị njikere ichekwa ihe niile gbasara ntụlịaka a.
Adamu kwuru na ha ezipụla ndị uweojii puku iri atọ na ise na narị abụọ gawa Kogi ebe ha zipụru puku iri ato na abụọ na iri anọ na otu gawa Bayelsa.
EFCC

Ebe foto si, EFCC/Facebook
Onye nọ dịka onyeisioche ndị EFCC bụ Ibrahim Magu ekwuola na ha ga-ebido inyocha ndị Dọkita na-enye akwụkwọ adigboroja maka ahuike nke ndị omekome jị agbanagharị ikpe ruru ha.
N'aka nke ọzọ ka ndị EFCC nwuchiri mmadụ iri na isii bụ ndị isioche okpuruọchịchị dị na kwara steeti maka imefu ijeri Naira anọ n'ụzo na ezighị ezi.
EFCC gwuru na mmadụ iri na isii a bitere nde naira anọ were kpebie na ha ga-eke otu narị nde naira na etiti ha.
N'ofesi

Ebe foto si, Getty Images
Ndiagha mba Mali mmadụ iri anọ na itoolu tufuru ndụ ha mgbe ndị otu oyi egwu wakporo ha na abalị Fraịde.
Amabeghị ndị otu kpara arụ a mana a na-arọ anya na otu akpọrọ Ansaru Islam bụ ndị aka ha dị na ya.

Ebe foto si, Getty Images
Gọọmentị India ekeela ụmụakwụkwọ ihe eji ekpuchi imi ruru nde ise maka ajọ ikuku jụpụtara na New Delhi.
Minista New Delhi bụ Arvind Keriwal kwuru na ọ bụ ahịhịa agbara ọkụ na steeti ndị ọzo na ebute ajọ ikuku a.
N'Egwuregwu

Ebe foto si, PA Media
Otu egwuregwu Rugby nke mba Saụt Afrịka eturula ugo n'asompi iko mba ụwa nke afọ 2019 bụ nke a gbara na mba Japan.
Saụt Afrịka meriri mba Ịngland iji mabulie ya bụ iko.
Nke a bụ nke ụgboro atọ ha na-eturu ugo na asọmpi iko mba ụwa na Rugby.
Ha gunyere afọ 1995, 2007 na 2019.

Ebe foto si, Getty Images
Ndị otu egwu bọolụ Naijirịa bụ Golden Eaglets dara ọnyụpa dịka ndị Australia ji ọkpụ goolu ha satara otu merie ha na asọmpị iko mba ụwa nke ndị ntoroobia.
Na agbanyeghị nke a, golden Eaglets ga eso gbaa agba nke anọ na asọmpị a.
Gee nkeji ebe a:











