Police attack: Ndị omekome gburu nwaanyị dị ime onye uweojii na Bayelsa

Ndị uweoji Naịjiria

Ebe foto si, Getty/AFP

Onyeisi ndị uweojii bụ Adamu Mohammed ezipula ndị otu ya ha ka ha chọpụta ndị wakporo ụlọ rụ ndị uweojii n'obodo Agudama Ekpetima dị na Bayelsa steeti.

Ndị uweojii sị na ndị ojiegbe wakporo ụloọrụ ahụ n'ụtụtụ taa bụ abalị nke mbụ nke ọnwa Jụlaị 2019.

Mwakpo a, dịka ndị uweojii si kwuo, tara isi otu onye uweojii aha ya bụ Ola Rosanla na ndị uweojii ato ọzọ.

Ha sịkwa na mmadụ abụọ ọzọ merụrụ ahụ.

Maazị Mohammed nyere iwu ka ezipu ndị uweojii si na ngalana nyocha pụrụiche akpọrọ "IGP-Intelligence Response Unit" (IRT) na ndị ọzọ si na ngalaba "Forensic and Homicide" nke FCID nakwa nke uweojii ndi mmiri.

Akụkọ kọrọ na nwaanyị dị ime onye ụweojii so na ndị egburu na ya bụ nwakpo.