Yahoo yahoo: Anyị na-anwụchi ọtụtụ ha n'ọwụwanyanwụ - EFCC
Akụkọ dị mkpa
'Yahoo yahoo' akala nkụ n'ọwụwanyanwụ - EFCC

Ebe foto si, EFCC/Facebook
Ụlọọrụ EFCC nke mpaghara ọwụwanyanwụ ekwuola na mpụ eji igwe Kọmputa na ịntanet eme a kpọrọ 'Yahoo Yahoo' na-arị zi ibe ya elu na mpaghara ọwụwanyanwụ.
Onyeisi ụlọọrụ a na mpaghara ọwụwanyanwụ bụ Usman Imam gwara ndị ntaakụkọ nke a n'Enugwu dịka ọ na-ekwupụta ọrụ n'ọkara afọ 2019.
Mana onye ọrụ ha na-ahụ maka mmekọrịta ohanaeze bụ Chris Oluka gwara BBC Igbo na ha chọpụtara nke a site na mkpesa ndị mmadụ nakwa nyocha ụlọọrụ ha mere.
O kwuru na ndị a karịchara na ndị ntoroọbịa na-efe ala nna ha (NYSC), ụmụakwụkwọ Mahadum na nke Sekọndịrị.
Oluka kwuru na ụdị ụgbọala, ụlọ obibi nakwa ndụ oke ọnụ ahịa ha na-ebi n'enweghi ezigbo ihe ha na-arụ bụ ihe mgbawa obi nye obodo.
Oluka gara n'ihu kwuo na ụlọọrụ ha nwụchiri ndị ntoroọbịa iri atọ na asaa n'Owerri bụ ha siri na-eji kọmputa eme mpụ dị iche iche.
Gọv Lalong abụrụla onyeisi ndị gọvanọ mpaghara ugwu

Ebe foto si, @simonlalong
A họpụtala Gọvanọ Plateau Steeti bụ Simon Lalong dịka onyeisi ndị gọvanọ mpaghara ugwu nke Naịjirịa.
Ọ bụ ndị ogbo gọvanọ ndị ọzọ họpụtara n'ụbọchọ Fraịde n'ime nzukọ ha mere na Kaduna.
N'ofesi

Ebe foto si, EPA
Mba Taiwan abụrụla mba mbụ na mpaghara Asia ga-eme iwu ka nwoke lụọ nwoke nakwa nwaayị ịlụ nwaanyị ibe ya site na ntuliaka mere n'etiti ndị omeiwu ha.
Ndị nke a metụtara tiri bụ ndị nọ n'okpuru mmiri ozizo na-ache ka achabie iwu a ji mkpu na akwa ọṅụ dịka ndị omeiwu ha kwupụtara nke a dịka iwu.
N'egwuregwu

Ebe foto si, Getty Images
Onye nchịkọta otu Manchester City bụ Pep Guardiola ekwuola na aka Man City dị ọcha n'ebubo eboro na ha dara iwu na-achịkọta mmefu ego na bọọlụ.
N'aka nke ọzọ Juventus ekwuola na onye nchịkọta ha bụ Massimiliano Allegri ga-awụsa ọwa na ngwụcha egwuregwu nke afọ.
Nkeji
Ihe nkiri
Nwaafọ Naịjirịa ọzọ abụrụla Mayor na London

Ebe foto si, Victoria Obaze
Nwafọ Naịjrịa ọzọ sị n'Imo steeti abụrụla Mayor nke London Borough Tower Hamlets.
Ọ bụ Victoria Obaze, nwaanyị onye isiojii mbụ ruru ọrụ dịka mayor nke London Borough Tower Hamlets ma bụrụkwa onye nke atọ sị Naịjirịa meriri ntuliaka ma bụrụkwa Mayor na London n'izu atọ na-aga.
Ebugharịala ntuliaka Bayelsa na Kogi

Ebe foto si, AFP
Unu a nụla e, na Inec ebufeela ntuliaka ndị Bayelsa na Kogi steeti site n'abali abụọ ga n'abali iri na isii nke onwe Nọvemba 2019.

Ebe foto si, Inec
Nke a bụ maka mkpu ndị gọọmenti na steeti ahụ tigaara ha maka ụbọchị mbụ ahụ etinyere ya bụ ụbọchị ndị Bayelsa ji eme emume ikele chukwu maka ihe ọma ọmeere ha.
'Anyị chọrọ ntoroọbịa, nwere isiakwụkwọ, ma marakwa asụ Bekee nke ọma n'Amerika' - Trump

Ebe foto si, Getty Images
Ọ bụrụ na ị bụ onye ntorobịa, nwee isiakwụkwọ, mara asụ Bekee nke ọma, ị nwere ohere ịba Amerika ga biri.
Donlad Trump onyeisi mba Amerika kwuru nke a mgbe o kwuru na ya agaghịzị anabata mmadụ na mba ahụ maka ndị be ha bị na Amerika, kama onye ga-abara Amerịka uru.
Lee ihe nkiri anyị nke taa
Falcons awufeela agba nke ikpeazụ na WAFU

Ebe foto si, NFF/twitter
N'egwuruegwu, Super Falcons nke Naịjirịa awufeela na agba nke ikpeazụ site na ọkpụ anọ asatara abụọ ha ji merie Ghana.
Naịjirịa na Cote d'Ivoire ga-akwata ya na agba nke ikpeazu echi bụ Satọde ụbọchị iri asatọ nke ọnwa Mee.
Gee Nkeji Igbo ebe a
Gụọ akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị











