International Widows Day 2019: Kedụ ihe bụ ebumnuche gị maka ịgba mkpe?

Nwaanyị a na-akpụ isi

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Kamgbe ụka batara ala Igbo, ọ bụghịzi ebe niile ka a na-akpụ nwaanyị na-agba mkpe isi

N'ala Igbo, ịgba mkpe bụ ọmenala nwaanyị di ya nwụrụ anwụ kwesịrị ime iji gosi na ọnwụ di ya wutere ya ọfụma.

Na gboo, ndị Igbo na-ekwu na nwaanyị na-ekweghị agba mkpe di ya ma ihe gburu ya.

Mgbe gboo, ụfọdụ na-enye nwaanyị ahụ mmiri eji saa ozu di ya ahụ ka ọ ṅụọ ma ọ bụrụ na a na-enyo ma aka ya ọ dị n'ọnwụ di ya.

N'ụfọdụ obodo, ọ bụ nwaanyị di ya nwụrụ kwesịrị iji akwa na mkpu otiti mete ndị na-arahụ ụra n'isi ụtụtụ.

Ụfọdụ na-ahapụ nwaanyị ahụ n'ime otu ọnụụlọ ebe adọwara ozu di ya, ka ya na ya nọrọ abalị ole na ole tupu elie ya.

Ebe ụfọdụ, anaghị ekwe nwaanyị na-agba mkpe saa ahụ ruo oge a ga-etinye ozu di ya n'ala. Mgbe gboo, a ga-eduru ya gaa n'akụkụ mmiri iyi ebe a ga-asa ya ahụ ma kpụọ ya isi na ntutu niile dị ya n'ahụ.

Aha onyonyo, Ndụmọdụ Charly Boy maka alụm di na nwunye

Ụfọdụ anaghị ekwe nwaanyị isi mkpe rie nri ọha niile na-eri maka na ha kwetara n'onwere ike igbu ya, a na-esi nri nwaanyị isi mkpe na-eri iche.

Mgbe gbuo, nwaanyị na-agba mkpe di ya bido oge ọ nwụrụ ruo ọnwa isii maọbụ otu afọ, mana ka ụka batachara ala Igbo, ụfọdụ na-agba nkpe nanị afọ atọ.

Etu esi ama nwaanyị na-agba mkpe

N'agbanyeghị n'ụka batara ala Igbo gbanwee ọtụtụ ihe, ụfọdụ obodo ka na-eme emume ịgba mkpe nke kpatara n'onye ọbụla hụrụ ya ga-ama na ọ bụ nwaanyị di ya nwụrụ.

  • Ụfọdụ na-eyi uwe ojii: Ha ga-eyi ma uwe ojii, ọlantị, mgbaolu na mgbaaka ojii, akpụkpọụkwụ ojii na ihe niile oyi n'ahụ ga-abụ nke ojii.
  • Ụfọdụ na-eyi uwe ọcha: Ihe niile oyi site n'isi ruo n'ụkwụ ga-abụ nke ọcha.
  • Ndị ụmụada ga-akpụcha ntutu niile dị ya n'ahụ
  • Ụfọdụ na-akwụsị ọrụ maọbụ ịzụ ahịa, ruo mgbe ọ gbachara

A ka na-agba mkpe n'ala Igbo?

A ka na-agba mkpe n'ọtụtụ obodo dị icheiche n'ala Igbo, kama etu esi agba ya bụ mkpe agbanweela.

Ọbibịa ụka na agụmakwụkwọ mere ka ntaramahụhụ nwaanyị na-agba mkpe na-ata belata.

Ụfọdụ ndị di ha gụrụ akwụkwọ na-enye iwu tupu ha anwụọ, sị onye enyekwala nwunye ha nsogbu maọbụ taa ha ahụhụ.

Aha onyonyo, Anyị alụọla afọ 57 mana anyị anaghị atọ ka shuga mgbe niile