Discrimination: Ị ma na ị nwereike ịkpa oke na-amaghị ama?

Ụmụ nwanyị abụọ makọrọ onwe ha

Ebe foto si, Getty Images

Ịkpa oke bụ ihe ọtụtụ mmadụ na-akagbu ma sị na ọ jọgburu udele ma sigbuo nkapị.

Mana, ị ma na ọtụtụ mgbe ndị mmadụ na-akpa oke dị icheiche na-amaghị ama.

Nke a na-akacha emebi ihe n'ihi na onye na-akpa ya bụ oke amaghị maọbụ ekweteghị na ọ na-akpa oke.

Otu ihe dị mkpa ka ị mata bụ na ịkpa oke dị iche iche.

Lee ụzọ ị nwereike isi na-akpa oke na-amaghị ama:

1: Ịma mmadụ maọbụ 'Nepotism' na Bekee

Ụmụnwoke abụọ na-ele anya n'igwe Kọmpụta

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ị ga-enye enyi gị ọrụ ma ọ bụrụ na ọmaghị ya bụ ọrụ?

'Nepotism' pụtara mgbe onye nọ n'ọkwa ji ike ya wee nye nwanne ya ma ọ bụ enyi ya ọrụ ma ọ bụ ihe nrite ndị ọzọ nanị maka na ọ ma onye ọ bụ.

Ị nwere ike sị na ọnweghị ihe ọ mere mana chetakwa na onye kwesiri ka enye ya ọrụ ahụ nọzị nkịtị.

Ụzọ kacha mma i ji kwụsị 'nepotism' bụ ịhụ na onye ọbụla nwetara ihe ruuru ya, na-agbanyeghi onye ọ ma maọbụ ebe o si.

2: Enwetaghị ntaramahụhụ nke Bekee na-akpọ 'Impunity'

Ndị nọ na nga

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ndị nọ na nga

Ụfọdụ mgbe ihunaanya anaghị ekwe ndị mmadụ inye ndị mmadụ nataramahụhụ ruru ha.

Nke a ka a na-akpọ "Impunity" n'asụsụ bekee ebe ị nwere ike ịkpọ ya "enwetaghị ntaramahuhu" n'okwu igbo.

Ụdị ihe a na-adịkarị ire n'ezinụlọ ebe nne ma ọ bụ nna anaghị ekwe ata ụmụ ha ahụhụ mgbe ha mere ihe ọjọọ maka na ha hụrụ ha n'anya.

I ji gbochie ya, gbaa mbọ na-erube isi n'ihe iwu kwuru.

Cheta na dịka ọchịchi na iwu obodo sịrị dị, ọ bụ iwu obodo kachasị di mkpa karịa ofufe dị iche iche.

Nke a pụtara na otu ọ bụla osiri dị, ị ga-ajụ onwe gị, " Gini ka iwu obodo kwuru maka nke a".

3: kpa okeagbụrụ nke Bekee na-akpọ 'Racism'

Raheem Sterling na agbara ndị otu Manxchester City

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Sterling nke Manchester City yị mgba aka edere "Respect" ị jị megide ịkpaoke agbụrụ

Nke a bụ nsogbu so wee kpata agha mba ụwa nke abụọ bụ nke a kpọrọ 'World War Two' na Bekee.

Ọ bụkwa ya butere nsogbu na mba Saụt Afrịka ọtụtụ afọ gara aga bụ nke a kpọrọ 'Apartheid'.

Mana ruo taa, ịkpa oke agbụrụ ka na-enyekwa nsogbu n'akụkụ ụwa niile.

Bido na mba Amerịka ruo Rọshịa, gaa Jamanị, bata Briten ọtụtụ ka na-akpa oke agbụrụ.

Ikpa oke agbụrụ bụ nkwenye na otu agbụrụ ka nke ọzọ mma n'ụzọ ọbụla.

Mana nke a abụghị eziokwu n'ihi na mmadụ niile bụ otu ma ndị ojii ma ndị ọcha.

4: kpa oke obodo (Tribalism)

Ikpa ọke obodo bụ mgbe mmadụ kwenyere na obodo ya ka obodo ndị ọzọ mma.

Ọtụtụ ekwuola na nke a sọ na otu ihe na-enye obodo Naijirịa nsogbu.

Oge ntụlịaka na Naijirịa, otụtụ mmadụ na-atụnyere onye nke ha maka na ha si otu obodo.

Ọtụtụ ndị mmadụ ji maka ihe ha nụrụ maka obodo ndị ọzọ were too.

Ọ dị mkpa ka mmadụ niile mara ma nabata obodo ndị ọzọ na asụsụ nakwa omenala ha, ma kuzikwaara ụmụ ha ime otu a.

5: kpa oke ndị ọba nke Bekee na-akpọ 'Xenophobia'

Ndị oke agbụrụ ọbia metụtara

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ndị oke agbụrụ ọbia metụtara na Saut Afrịka

Ebe nke a kacha pụta ihe nsonso a bụ na mba Saut Afrịka dịka ha sị ndị mbiarambia ka ha sị obodo ha pụọ.

Ọ bụrụ na iwe na-ewe gị maka ndị ọbịa bi na obodo gị, lezie kwa anya na ị nwere ike ị na-akpa oke ndị ọbịa.

Ihe nke a gosiri bụ na onwe gị ejughị gi afọ nke mere na ị kwenyere na ọ bụ ndị mbiarambia mere na ịtozughị etu ị kwesịrị.

Ọ dị mkpa ka ịghọta na-enweghị onye gị na ya na-azọ obodo ma kwere na ị gbaa mbọ na ị ga-enwetakwa nke gị.