Ivana Trump: Donald abụghị onye na-akpa oke agbụrụ

Ivana kwuchitere Donald Trump ọnụ
Nkọwa foto, Ivana kwuchitere Donald Trump ọnụ

Nwunye nke mbụ Donald Trump siri na ọ bụ eziokwu na onye isị ala Amerika nwere ike me nkwuegheri oge ụfọdụ mana ọ bụghị onye n'akpa oke agbụrụ. Onye isi mba Amerịka bụ Donald Trump gbara isi onwe ya taa, sị na ọ bụghị onye na-akpa oke agbụrụ.

N'izu gara-aga, Akụkọ kwuru na Trump kpọrọ ụfọdụ mba dịka Haiti, El Salvador na mpaghara Afríka 'ndị ajụrụ ajụ' ka ya na ụfọdụ ndị omeiwu ukwu nọ n'ọgbakọ na-akọ maka ndị mbịarambịara.

Igbara isi onwe ya, Trump gwara ndị nta-akụkọ "Abụghị m onye na-akpa oke agbụrụ. Abụ m onye ikpeazụ ị ga-agba ajụjụ onụ bụ onye ịkpa oke agbụrụ."Donald Trump achịala mba Amerịka otu afọ

Nke a bụ nke mbụ Trump na-asa ebubo ajụrụ ya gbasara ịkpa oke agbụrụ.

Ọ gọnarịrị ebubo a ka ndị nta-akụkọ White House bịakutere ya na Trump International Golf Club dị na West Palm Beach, n'abalị Sunde gara aga.