Mesut Özil: Agaghị m agbara Jamini bọọlụ ọzọ

Ebe foto si, Getty Images
Mesut Özil bụ aha a ma ama n'egwuregtwu bọọlụ na mbaụwa eziela ozi kwuo na ọ gaghị agbara mba Jamini bọọlụ ọzọ maka ịkpa oke agbụrụ na mkparị ndị ụlọọrụ ntaakụkọ dị icheiche na-enya ya na Jamini.
O depụtara ozi a n'elu akara soshal midia nke Twitter ya na o teela aka ndị ntaaakụkọ na-akparị ya maka na ọ bụ onye si mba ọzọ bụ Tọki n'abụghị Jamini.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
O kwuru na ndị ntaakụkọ ahụ gbadoro aka na ọ bụ onye Tọki jiri na-ata ya ụta maka na a gbapụrụm Jamini n'Iko mbaụwa nke 2018.
Ọ sị "ọ bụ obi tiwara etiwa na oke nwute ka m ji kpebie ịkwụsị ịgbara otu egwuregwu mba Jamini bọọlụ"
"Ọ bụ maka na DFB kparịrị m, kparịa agbụrụ m nakwa jiri m mee ihe ndọrọndọrọ ka m ji kwuo nke a. Ya bụ ihe ejula m afọ."
Cheta na Özil bụ onye Jamini na kwa Tọkị na-agbara otu egwuregwu Arsenal nke mba Briten bọọlụ.






