Boko Haram wakporo anyị n'ezie - Ndị agha Naịjirịa

Ebe foto si, Getty Images
Ndị na-eyi ndụ egwu a kpọrọ Boko Haram awakpoola ọdọ ndị agha Naịjirịa nke agba '233 Battalion' n'okpuru ọchịchị Babbangida nke Yobe steeti ụnyaahụ.
Nke a ga-eme ya nwakpo abụọ a ga-eme ndị agha Naịjirịa n'ime abali ole na ole gara aga.
Ndị agha kwuru na ha gbara mbọ napụta ndị Boko Haram ahụ ike n'obodo ahụ ma chụpụkwa ha.
E mefuru ndụ ụfọdụ ndị agha n'ọgụ a lụrụ mana ekwuputabeghi ọnụọgụgụ mmadụ ole nwụrụ na ya.
Dịka ọ dị ugbua, ndị agha elu jisike enyocha mpaghara ahụ ịchọta ndị ka dị ndụ ma ndị oyiegwu na-ezo ezo.
Ndị agha ahụ rịọrọ ndị mmadụ ha ekwela ka obi mapụ ha maọbụ tụọ egwu.
Cheta na a nụrụ kepu kepu na ndị agha ruru mmadụ 28 nwụrụ n'izuụka gara aga ebe ndi Boko Haram wakporo ha ma gbaa ụfọdụ ụgbọ agha ọkụ.



























