Imo State Politics: 'Echeghị m na pati PDP machịrị Uche Ogbuagu' - Ọnụ na-ekwuru PDP n'Imo

Ogbuagu na Damian Oparah

Ebe foto si, BBC/Damian's Watsapp

Ọnụ na-ekwuru otu ndọrọndọrọ ọchịchị 'Peoples Democatic Party' bụ Damian Oparah ekwuola hoohaa na o cheghị na o nwere mgbe ndị patị ya ji machie Uche Ogbuagu.

Cheta na Uche Ogbuagu na-anọchịte anya obodo Ikeduru n'ụlọomeiwu Imo steeti kwuru na ihe mere o ji wụbanye na pati All Progressive Congress bụ maka ọgbaghara dapụtara na PDP nke Imo.

Damian kwukwara na ọ gaghị agbagha ihe Ogbuagu kwuru maka na ọ bụ uche ya ka o na-ekwu.

Mgbe BBC Igbo jụrụ ya ma PDP nke Imo steeti a nọ n'ọgbaghara, o kwuru na ọ gaghị asanwu anyị ajụjụ ahụ.;

Ọ gara n'ihu kwuo na nnukwu ọgbakọ PDP ga-enwe n'abali asaa nke ọnwa Maachị ga-egosi ọnọdụ patị ahụ nọ ugbua.

Ndị ekperima egbuola ihe ruru mmadụ 50 na Kaduna

An sace Basarake a Kaduna

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ndị uweojii kwuru na ha na-enyocha etu ya bụ ihe si mee.

Ihe ruru mmadụ iri ise alaala mmụọ na Kaduna steeti site n'aka ndị ekperima.

Ndi ekperima wakporo mpaghara Kerawa, Zareyawa na Minda na abalị Sọnde ma gbuo ọtụtụ ndị mmadụ.

Zayyad Ibrahim, onye na-anọchite anya mpaghara ndị ahụ n'ụlọomeiwu, gwara ndị ntaakụkọ na ha eliela mmadụ iri ise n'otu ugbua, ebe ọtụtụ ndị ọzọ ka nọ n'ụlọọgwụ.

O teela aka ndị ekperima kpawa ike na Kaduna steeti.

Gọọmentị Kaduna nakwa ndị uweojii sị na ha na-enyocha ya bụ ihe.

Dayyabu Kerawa onye ji ọkwa 'councillor' n'okpuru ọchịchị ahụ kwuru na ndị ekperima ahụ na ihe ha ji wakpo obodo ahụ bụ maka na ndị ebe ahụ gwara ndịagha ebe ha na-ezo.

Kerawa kwukwara na ọtụtụ ndị merụrụ ahụ na mwakpo ahụ ka nọ n'ụlọọgwụ.

Onyeisiala Gunie Bissau chịrị naanị otu ụbọchị

Ndị agha

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Cipriano Cassama bụbụ onyeisi ndị ụlọomeiwu Guinea Bissau tupu ọ bụrụ onyeisiala nwa mgbe nta

Ndị ụlọomeiwu họpụtara Cipriano Cassamá dịka onyeisiala mgbe nsogbu dapụtara na ntụliaka emere na mba ahụ na Disemba 2019.

Mana Cipriano riri mbombo ọsọ ka ọ chịchara sọsọ nanị otu ụbọchị, ma na-ekwu na ndụ ya nọ na nsogbu.

Nke a mere agbanyeghị na e dubuola onye agha Umaro Cissoko Embaló dịka onyeisiala n'ụlọ oriri na nkwarị n'isi obodo mba ahụ.

Gụinea Bissau enwela mwakpo ọchịchị ruru itoolu kamgbe afọ 1980.

Etu esi eke nkwụcha gbasara Coronavirus n'ọdọụgbọelu Naịjirịa

Coronavirus

Onye ntaakụkọ BBC gara ịmata ihe na-eme n'ọdọụgbọelu Port Harcourt kwuru na ndị ọrụ ahụike "Nigeria Center for Disease Control" nọ na-enyocha ndị mmadụ si mba ọzọ abata Naịjirịa.

O kwuru na ndị ọrụ ahụike ahụ na-enyocha ka ha mara ma ndị njem e bu ahụọkụ, ụkwara, azụzụ maọbụ ekughị ume ọfụma nakwa ahụike ha na nchịkọta.

Ha nyerekwara ndị njem akwụkwọ ha ga-eji debanye aha ha ka ọ ga-abụ ihe ọbụla dapụtaranụ , ka ewe mara ka esi esochi ha ma nye ọgwụgwọ.

Ọdọụgbọelu

Ndị ọrụ ike ahụ na-enyochakwa mba ha si bata maọbụ agatụla Chiana, Itali, Saụtụ Korea maọbụ Japan nso nso a.

Coronavirus Update: Ndị Chaịna anọ amachịrị maka ọrịa a na Jos ebughị ya

Coronavirus

Ebe foto si, Reuters

Iheọma emerela ndị Chaịna anọ amachiri ngagharị maka igbochi mfesa Covid-19 na Plateau steeti.

Minista na-ahụ maka ahụike na Naịjirịa bụ Osagie Ehanire kwuru na ha anọ lafere ije na nyocha e mere ha maka ọrịa ahụ.

Cheta na gọọmenti Plateau kpọsara ndị Chaina anọ a eche na ha bu ya bụ ọrịa n'ụbọchị Satọde gara aga.

Osagie kwuru na ka o si kwụrụ ugbua, onweghị onye bu ya bụ ọrịa na abụghị sọ nwoke Itali enyochatara ya n'ahụ ya nso nso a.

Mịnsịsta ahụike kwuru ihe ndị a na mkparịtaụka ya na ndị ntaakụkọ nwere na Abuja ma na-ekwu na ya bụ nwoke Itali na anabata ọgwụgwọ zuruoke.

Ka ọ dị ugbua, ngalaba ahụ na-enyocha mmadụ iri na itoolu na Legọs nakwa mmadụ iri atọ na itoolu na Ogun steeti ya na nwoke Itali chakọrịtara mgbe ọ batara na steeti ndị a.

Akụkọ ndị ga-amasị gị