Coronavirus in Nigeria: Kedụ ndị ọ bụ ọrụ ha igbochi Coronavirus ịbata na Naịjirịa?

Ọgbakọ ndị ntaakụkọ maka Coronavirus
    • Onye dere ya, Adline Okere & Chris Sanctus Okereke & Chimamaka Ihenacho
    • Ndị mere akụkọ a, Editor, BBC Igbo

Dịka ministri na-ahụ maka ahụike kwuputarala na ọrịa Coronavirus abatala Naịjrịa, ndị ọnụ na-erụ n'okwu akọwaala na ọ bụ ọrụ gọọmenti etiti ịhụ na ya bụ ọrịa abataghị na Naịjirịa.

Jimi Disu bụ onye ntaakụkọ ọnụ na-eru n'okwu, kwuru na ministri na-ahụ maka ahụike kwesịrị ịnọ n'isi ya bụ mgbochi ọrịa.

Ọ kpọkwara aha ministri na-ahụ maka ọpụpụ na mbata a kpọrọ immigration na Bekee, nakwa Ministri na-ahụ maka njem ụgbọelụ bụ Aviation na Bekee dịka ndị ọzọ kwesịrị iso na ya bụ ọrụ.

Ndị Naịjirịa si njem lata

Ebe foto si, Getty Images

Ọ sị na ọrụ ministri bụ ịhụ na e nyochara mmadụ niile na-abata n'ala a.

Disu sị na ya bụ ọrụ abụghị ọrụ otu onye maka na a tụrụ anya na gọọmentị etiti kwesịrị ihibe kọmitii ga-ejikọta ndị niile ga-arụ ya bụ ọrụ.

Otu a ka ha ga-esi hibekwa kọmitii ndị a na steeti niile bụ nke ha ga na-elekọta.

Disu kwukwara na "gọọmentị kwesịrị ịkpọrọ ọrụ mgbasaozi maka igbochi ọrịa mkpa, iji hụ na esi ụzọ dị iche iche zisaa ya bụ ozi".

Ka e si amata ọrịa Coronavirus

Ka e sị amata Coronavirus

Ka esi egbochi ọrịa Coronavirus

Ndị na-ahụ maka ahụike na-ekwu ka ndị mmadụ mee ihe ndị a iji gbochie ya bụ ọrịa ruo mgbe a chọtara ọgwụgwọ ya.

  • Kpuchie imi na ọnụ mgbe ị na-akwa ụkwara maọbụ na-ama uzere (ọ ka mma ịmanye ya n'ikpere aka gị)
  • Gbado anya, mara etu gị na onye na-akwa ụkwara maọbụ na-ama uzere si emekọrịta
  • Jiri mmiri na ncha na-akwọ aka gị kwa mgbe kwa mgbe.
  • Gbaa mbọ hụ na ị naghị emetụ ihu gị aka kwa mgbe
  • Gbaa mbọ hụ na e siri akwa na anụ ị na-eri ọfụma tupu i rie ya.

Onwere ọgwụ mgbochi?

O nwebeghị ọgwụ e ji agwọ maọbụ gbochie ọrịa a ka ọ dị ugbua, dịka otu mbaụwa ahụike bụ World Health Organisation si kwuo n'ọbaozi websaịt ha.

Akụkọ ga-amasị gị