Heat in Nigeria: Etu ị ga-esi gbanahụ ọrịa ndị a okpomọkụ na-ebute

Ebe foto si, Getty Images
Oke okpomọkụ nwereike ibutere gị ọtụtụ ọrịa, ya ka o ji dị mma ka ịmata ọrịa ndị a ma chekwa onwe gị nkeọma.
Kamgbe izuụka a ka ụmụ Naịjirịa na-eti mkpu na okpomọku na-eme ha ịwa mana lee ọrịa dị iche iche ya bụ ọnọdụ nwereike ibunye gị.
Ọrịa okpomọkụ na-ebute gụnyere ndị a dọkịnta Chidi Akaghara kpọpụtara

Ebe foto si, Getty Images
- Ọrịa meningitis
- Ihe nhakasị n'ahụ na-acha uhie uhie(Rashes)
- oke igbapụta mmiri si n'ahụ na oke okpomọkụ(Heat exhaustion)
- Ọdịda n'ike okpomọkụ na-ebute(Heat fainting)
- Okpomọkụ na-ericha mmiri niile dị n'ahụ mmadụ. Dr Akaghara kwuru na nke a nwereike igbu mmadụ maọbụrụ na ọgwụgwọ abịaghị ọsịsọ.
Kedụ ka ị ga-esi chekwa onwe gị ugbua ebe niile na-apụ ọkụ?
- Gbaara ebe ọbụla oke okopomọkụ dị ọsọ
- Na-aṅụ mmiri mgbe ọbụla
- Yiri uwe nwereike ikpuchi gị maka oke okpomọkụ ịmetụta ahụ gị
- Kpuru okpu maọbụ ugegbe anya maọbụrụ na ị na-agakarị n'anwụ maọbụ na ị na-arụkarị ọrụ n'okpuru anwụ.





