Healthy living: Ka ị ga-esi gbanahụ 'ọdịda n'ike' na-ebute ọnwụ.'

Onye dara ada
    • Onye dere ya, Chioma Obianinwa
    • Ndị mere akụkọ a, Senior Broadcast Journalist, Igbo

Dika a na-enweta akụkọ ndị mmadụ na-anọkata daa nwụrụ, ọ na-agbagọjụ ụfọdụ anya etu dimkpa maọbụ agada agada nwaanyị ga-esi nọkata daa ma nwụrụ.

Dibia bekee bụ Chidimma kwuru ihe ole na ole nwereike ịkpata ya bụ ọdachị nakwa ogbugbo ya.

Aha onyonyo, Maternal mortality rate: Ịmụ nwa ebe na abụghị ụlọọgwu nwereike imenina nne na nwa -Dọkita

Ihe ụfọdụ ụzọ ndị ahụ dọkịta Chidimma kpọpụtara.

Onye dara ada

Ebe foto si, Getty Images

1.Oke ndọli: O kwuru na nsogbu a na-emekarị n'etiti ndị ọgbara ọhụrụ a na-adọlị n'ime oke ahụhụ ịkpata ihe ọnụ ga-eri.

Ogbugbo: Nwete ezumike zuruoke.

2. Oke ọbara mgbalielu:

Ogbugbo: Na-anwụ ọgwụ ga-ebutedata ya nke dọkịta gị ji aka ya nye gị.

3. Oke ọbara mgbatu ala:

Ọgbugbo: Lele ahụ gị n'ime ọnwa isii ọbụla ka ịchọpụta nke a ma nata ndụmọdụ zuruoke n'aka dọkịnta gị

4.Afo ime: Dọkịta Chidimma kwuru na ndị ime nwereike ịda mgbe ọbụla.

Ogbugbo: Nata dọkịta gị ndụmọdụ ma ịchọpụta na ị na-adakarị ma ị dị ime.

5.Anwụghị mmiri: Nke a pụtara na onye ahụ anaghị aṅụ mmiri ọfụma.

Ogbugbo: Dọkịnta Chidimma kwuru na ọ ga-adịmma ka mmadụ na-agba mbọ hụ na ọ na-aṅụ mmiri ugboro gboro n'ụbọchị

6. Oke egwu

Ogbugbo: Ihe hija gị n'ike ,jide obi aka.

7. Oke ụfụ

Ogbugbo: Nabata ọgwụ dọkịta gị nyere gị maka nke a

8. Etu isi ekulite n'ụra: Dọkịta Chidmma kwuru na etu mmadụ si ekulite n'ụra nwerike ịkwatụ ya n'ike maọbụrụ na omeghị ya ọfụma.

Ogbugbo: Ikulite n'ụra, tụgharịa n'akụkụ gị nọrọ oge tịnkọm tịnkọm, nọrọala oge tịnkọm tịnkọm, chituo ụkwụ gị n'ala oge tinkọm tịnkọm ma rituo n'oge na-adịghị anya n'elu akwa.

N'ikpeazụ dọkịnta Chidimma kwuru na ọ ga-adị mma ka mmadụ na-ewepụta oge na-aga na-enyocha ahụ ya opekatampe otu ụbọchị n'ime ọnwa isii.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: