Dexamethasone: Gịnị bụ ọgwụ a a sị nwereike ịgwọ coronavirus?

Ọgwụ Dexamethasone
    • Onye dere ya, Ikechukwu Kalu
    • Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist Igbo

Ndị sayensị chọpụtara na ọgwụ dexamethasone nwere ike inye aka n'ịgwọ ndị bu ọrịa coronavirus.

Ndị ọkachamara na mba Briten kwuru na ọgwụ a so n'otu n'ime ọgwụ ndị a na-enyocha, e nwere olileanya na ọ ga-agwọnwu ọrịa a.

Mana ọtụtụ mmadụ na-ajụ kedụ ọgwụ bụ dexamethasone na ihe mere e ji sị na o nwereike inye aka n'ịgwọ coronavirus?

Otu onye ọkachamara n'ihe banyere ọgwụ ma bụrụkwa otu n'ime ndị ọkachamara n'okwu ọgwụ na West Afrịka bụ Blessing Nwagbara, kọwara ihe ọgwụ a bụ.

Blessing Nwagbara

Ebe foto si, Blessing Nwagbara

Nkọwa foto, Blessing Nwagbara bụ ọkachamara n'okwu ọgwụ n'ụlọọgwụ Mahadum Abia Steetị dị n'Aba

Gịnị bụ Dexamethasone?

Nwagbara sị na dexamethasone bụ otu n'ime ọgwụ ndị ụlọọrụ ahụike mbaụwa bụ World Health Organization (WHO) kpọrọ ọgwụ dị mkpa kamgbe afọ 1977.

Ọ bụ ọgwụ kwesịrị ịnọ n'ụlọọgwụ maọbụ ebe niile a na-ere ọgwụ n'ụwa. O so n'ọgwụ ndị a na-akpọ 'ọzọ Igbo ndụ'.

O so n'ọgwụ ndị a kpọrọ 'Corticosteriods' bụ ọgwụ ndị e ji agwọ ọrịa ahụ ọzịza dị iche iche.

Ọ bụghị ọgwụ a rụpụtara ọhụrụ, ọ bụ ọgwụ dị kamgbe ọtụtụ afọ.

Kedụ ọrịa e ji Dexamethasone agwọ?

Ụdịrị dexamethasone dị iche iche

Ebe foto si, Getty Images

Ihe e ji Dexamethasone agwọ kpọmkwem bụ ọrịa ahụ ọzịza a kpọrọ 'Edema' na bekee, ọkachasị nke metụtara n'akpịrị nakwa akụkụ ndị e ji eku ume (Brochus).

Nke pụtara na e ji ya agwọ ndị nwere ọrịa iku ume Asthma.

E ji dexamethasone agwọ ọzịza ahụ nke metụtara ọkpụkụ azụ nakwa nke ụbụrụ.

E nwerekwara ike iji ya agwọ ọzịza metụtara anya.

Ụdịrị Dexamethasone ole ka e nwere?

Ọgwụ mgbochi ọrịa

Ebe foto si, Getty Images

Nwagbara sị na e nwere dexamethasone dị iche iche nke gụnyere;

Nke mkpụrụọgwụ (Tablets), nke a na-agba agba (Injections) nakwa nke a na-atanye n'anya (Eye drop).

Ọ sị na ọgwụ a abụghị nke a na-aṅụ otu ugboro ma kwụsị ya, na tupu ị ṅụọ ya maọbụ kwụsị ya na ị ga-anata ntuziaka onye ọrụ ahụike.

Gịnị mere e ji sị na o nwereike ịgwọ coronavirus?

Nwagbara sị na ihe mere e ji sị na ọgwụ a nwereike inye aka n'ịgwọ coronavirus bụ maka etu o si arụ ọrụ.

Dexamethasone na-akwụsị ọzịza n'akpịrị nke na-egbochi onye na-arịa asthma maọbụ ọrịa iku ume ndị ọzọ ka ọ ghara iku ume.

N'otu aka ahụ ka a sị na o nwekwara ike inye aka gwọọ coronavirus bụ ọrịa iku ume, ọkachasị n'ahụ ndị o ji aka ọjọọ ji igwe (Ventilator) eku ume.

"Ọ bụrụ na dexamethasone nwere ịke ịkpọpe okpoko ikuku onye na-arịa Asthma, n'otu aka ahụ, o nwekwara ike ịkpọpe nke onye na-arịa coronavirus".

Ọghọm dị n'ịṅụ ọgwụ Dexamethasone

Ọgwụ ọgbụgba

Ebe foto si, Getty Images

Nwagbara kwuru; "N'agbanyeghi na ọgwụ a juru ebe niile, ọ bụghị ya ga-eme ka mmadụ ṅụọ ya na-enweghi ntuziaka, maka ibute ọghọm".

Ọ sị na ụfọdụ ọghọm dị n'ịṅụ ọgwụ a gụnyere;

Ime ka mmiri dọkọrọ mmadụ n'ahụ (Fluid retention) nke nwereike ibute aka ọzịza, ụkwụ na ikpere ọzịza.

Oke agụụ ịgụ mmadụ nke mere na ọtụtụ ndị na-achọ ibu ibu na-eji aṅụkarị ya.

Ndị ọzọ gụnyere ịra ahụ n'ihi ụra, ịgbọ agbọ, afọ ọsịsa, ike ọgwụgwụ nakwa isi ọwụwa.

N'ikpeazụ, Nwagbara sị na ọ ga-adịkwa mma ma ọ bụrụ na gọọmentị Naịjirịa ga-enyocha ọgwụ Dexamethasone ma sị ka e were ya na-agwọ Coronavirus.

Maka na ọ bụ ọgwụ dị ọnụ ala ma jukwa ebe niile, nke mkpụrụ akarịghị naịra 50 ebe nke ọgbụgba akarịghị 200 naịra.