Coronavirus: Ọgwụgwọ ọrịa coronavirus na Naịjirịa, ọ bụ eziokwu ka ọ bụ aghụghọ?

Ebe foto si, Getty Images
Otu onye ndị gara nata ọgwụgwọ n'ogige nchekwa nje coronvirus bụ Raymond Dokpesi kụwara akịoyibo Nsugbe mgbe ọ nọchara na ya bụ ogige nchekwa coronavirus izuụka abụọ.
Dokpesi sị na onweghị ihe puruiche emere ya dịka onye a sị bu ya bụ nje coronavirus.
Ọ sị na ọ bụ ọgwụiba ka e nyere ya mgbe ya nọ ebe ahụ ya jiri gbakee.
Nke mere o jiri jụwazịa ihe gbasara ọrịa ịba na ya bụ nje coronavirus.
Nke a mere ka ndị mmadụ malite ile ya bụ ọrịa na ọgwụgwọ ya ka aghụghọ.

Ebe foto si, AFP/getty
Mgbe BBC kpọtụụrụ ndị otu e kpokobara maka ịchịkọta nchọpụta na nlekọta ndị bụ ya bụ ọrịa nke Nigeria Centre for Disease Control (NCDC) nọ n'isi ha, onye ndu ha bụ John Oladejo sị na ọnweghị ihe mgbagwoju anya dị n'ọgwụgwọ ya bụ ọrịa maka na usoro ha ji elekọta ndị nwere ya bụ nje kwụ ọtọ.
Gbasara Dokpesi, Oladejo zara na, "onye nọ n'ogige nchekwa anyị nwee ọrịa ọzọ, anyị ga-elebe ya anya. Ọ burụ iba ka onye ahụ nwere, anyị ga-enye ya ọgwụ ịba".
Ọ sị na onwere ọgwụ Bekee kpọrọ "antiretrovirals" na adị ha ahụ mma, mana kemgbe a matabeghị ọtụtụ ihe gbasara ya bụ ọrịa, e nwebeghị ọgwụ e ji agwọ ya..
Oladejo kwukwara na Nafdac na-elebe anya ịmata ka ọgwụ Chloroquine a ga-akwọlị ya bụ ọrịa a.









