Coronavirus Update: Ezinaụlọ ụkọchukwu Covid-19 gburu sị na ọ gara "njem n'ala mmụọ"

Ebe foto si, Kum Paul
Otu ụkọchukwu zọrọ ọkwa ọchịchị na mba Kamerun n'afọ 2018 bụ Franklin Ndifor anwụọla mana ezinaụlọ ya na-ekwu na ọ gara ezumike na mmụọ.
Ndifor bụ onyeisi Kingship International Church dị n'obodo Douala na ndị ọzọ zọrọ ọchịchị na ntụliaka 2018 na mba ahụ.
Mgbe ikpeazụ ahụrụ Ndifor n'ọha bụ mgbe ọ gara kee ndị mmadụ akụrụngwa iji kwọ aka ma gbochie mfesa ọrịa Covid-19.
Akụkọ kwuru na ndị ọrụ ahụike zipuru Dọkịta Gaelle Nanga si n'ụlọọgwụ dị na mpaghara Bonassama nke nyochara ahụ ụkọchukwu ahụ.
Gaelle Nanga gwara ndị ntaakụkọ na ọ nwụọla mana o dobeghi anya ihe mere eji kwuputa na ọ bụ Covid-19 gburu nwoke ahụ dịka emeghi ya nyocha maka ọrịa ahụ.
Mana ezinaụlọ nwoke ahụ gbachiri ụzọ be ya ma jichie ozu nwoke ahụ jụ ịli ya dịka ndị ụlọụka ya gbara be ya gburugburu ma malite ekpere na ị bụ abụ.
Kemgbe elekere iri na otu akpọpụtara ọnwụ nwoke ahụ, ọ bụ ebe elekere asaa nke mgbede ka ndị ụweojii ji gbaka ụzọ banye na be ya.
Ha ji ike mee ka elie ozu nwoke nwụrụ anwụ ma nwụchie nne ya na ndị ezinaụlọ ya ọzọ gbalịrị ịgbochi ha n'iburu ozu ahụ.









