Coronavirus in Nigeria: Etu mbepu ego na Bọjeetị 2020 ga-esi metụta gị

Nwanyị na-azụrụ osikapa n'ahịa
Nkọwa foto, Nwanyị na-azụrụ osikapa n'ahịa

Ọ bụghịzi akụkọ ọhụrụ na ndatu ego mmanụ agbịdị emeela ka gọọmenti etiti wetulata ego bọjeetị nke 2020.

Mana onyeisi oche otu a kpọrọ 'Nigeria Eonomic Summit Group' bụ Sam Ohuabunwa na-akọwa na atụmaatụ a pụtara na ụmụ Naịjirịa kwesiri ike nkwụcha maka ihe isiike ga-amalite n'oge adịghị anya.

O kwuru na ihe gọọmenti wepụrụ na bọjeetị 2020 ugbua bụ ihe ndị ga-eri oke ego ma gbado ụkwụ n'iji ego mee ihe ndị dịka ịzụta ọgwụ,nakwa ihe ndị ọzọ nwereike ịwebata ego.

Ihe ise atụmaatụ mbepụ ego na Bọjeet pụtaara ụmụ Naịjirịa

  • Uru adịghịzi n'ahịa mmanụ agbịdị ugbua
  • Ụfọdụ ihe mwulite obodo e kwesiri iji otu afọ wee rụpụta nwere ike iru afọ abụọ maọbụ karịa tupu arụchaa ya.
  • GDP Naịjirịa adapịala
  • Ndị ahịa ga-enwe obere nsogbu maka ụgwọ naira e ji azụta otu dọla nọ n'elu ọjị ugbua
  • Ụmụ Naịjirịa kwadoo maka ọtanisi na-abịanụ nso nso a
  • Ọtụtụ ihe a na-eji ebi ndụ na Naịjirịa si na mba ofesi abata

Lee ihe ndị o kwuru n'uju ebe a.

Aha onyonyo, Budget 2020 cut: Mbepu ego na bọjeetị Naịjirịa pụtara ihe ise ndị a

Ihe Naịjirịa ga-eme ka ntaramaahụhụ a belata

Maazi Ohuabunwa kwuru na agbanyeghị ihe isiike ga-adakwasị ụmụ Naịjirịa, gọọmenti mee ihe ndị a, ihe ga-adịtụ mma.

  • Wepụ oke ntụkwasị obi na mmanụ agbidi ma tinye anya n'ihe ndị ọzọ ga-ewepụtalị ego dịka ọrụ ubi, ịmepụta ihe n'aka onwe anyi, wdgz
  • Onye ọbụla chọta ihe ọzọ dị mma nwereike inye ha ego karịa sọ ihe ntụbata
  • Ụmụ Naịjirịa bido mepụtawa ihe ndị a ga na-eresi mba ndị ọzọ
  • Belata aka na etu i si emefu ego maka na ọtanisi kachasị nke na-abịa