Sleep: Uru ụra bara na ọnọdụ kacha mma ihi ụra

Ụra

Ebe foto si, Getty Images

    • Onye dere ya, Chris Sanctus Okereke
    • Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist

Igbo sị na-ụra tọwa ụtọ ekwowe ya ekwo.

Ochiedike aka na-aghọnkọ n'edemede, onye mba Briten bụ Thomas Dekker sị na ụra bụ ụdọigwe (chain) nke jikọtara ahụ mmadụ na ahụike ya.

Nke a gosiri uru ụra bara na ndụ mmadụ.

Ụra so n'ihe dịkachasiri mkpa mmadụ niile na-eme mgbe dum.

Onye anaghị arahụ ụra nwere nsogbu.

Mmadụ na-etinye otu ọkara n'ụzọ atọ (One third) mgbe ya n'ụra kwa ụbọchị.

Otu ahụ nrị na mmiri sị dịmkpa, otu ahụ ka ụra sịkwa dị mkpa.

Ị rahụ ụra zuruoke dị oke mkpa karịchaa.

Clara Inneze

Ebe foto si, Clara Inneze

Nkọwa foto, Clara Inneze sị na onye anaghị ehi ụra nke ọma kwesiri ịga ụlọọgwụ maka enyemaka

Clara Inneze bụ Klinikal Saịkọlọgist bụ ndị na-ahụ maka ahụike echiche mmadụ kwenyere na " ụra bara uru hienne nke bụ na ọ na-eme ka ahụ dị mmadụ mma."

Mmụta sị na onye anaghị arahụ ezigbo ụra na ụbụrụ ya anaghị ezuoke maka ọ bụ ụra na-enye aka ka ụbụrụ mmadụ akpakọọ ọnụ, nwee ike na-echeta ihe mgbe akpara ya aka.

Ụra na-enye aka ịme ka akwara ụbụrụisi nwee ike na-ezikọrịta onwe ha ozi dịka Clara si kwuo na "ọ bụrụ na mmadụ arahụghị ụra nke ọma ọ gaghị echeli echiche bara uru".

Akwara ụbụrụ

Ebe foto si, Science Photo Library

Ọ na-enyekwa aka ịme ka ụmụaka too ka ha kwesiri.

Ọ dị mkpa ka ị mata na ụbụrụisi mmadụ na ahụ ya nọ n'ọrụ mgbe onye ahụ na-ehi ụra.

Nchọpụta ọhụrụ kwuru na ụra na-enye aka iwepu ụnyi nke ime ụbụrụ Bekee kpọrọ "toxin" bụ nke na-akpụkọ mgbe mmadụ mmuanya.

Ụra na adị onye ọbụla ahụ mma, mana ọrụ ọ na-arụ n'ahu mmadụ dị omimi.

Nchọpụta na-akọwa na ụra bara ụrụ nye ihe niile na-arụ ọrụ n'ahụ mmadụ site na ụbụrụ, obi, ngụ, nakwa akụrụngwa na nyere ime ahụ aka ebuso nje ọgụ Bekee kpọrọ "immune system".

Nchọpụta a gosiri na e nweghị ụra zuruoke nwere ike ibutere mmadụ ọbara mgbalielu, ọrịa obi, ọrịa shụga, obi ọjọọ nakwa oke ibu.

Ugbua, sayensi amalitela ịghọta ka ụra si e nyere ahụ mmadụ aka.

Uru ụra bara na ndụ mmadụ

•Ọ na-enye aka ịme ka uche mmadụ kpokoọnụ

Akwụkwọ akụkọ intaneti bụ MedicalNewsToday na-akọwa na ọ nwere ọtụtụ nyocha ndị sayensi mere n'afọ 2000 gawa, bụ nke tinyere anya na-ọghọm dị n'echumụra.

Ihe ha chọpụtara na nkenke bụ na ụra nwere ọtụtụ ihe ọ na-eme n'ụbụrụ mmadụ nke gụnyere

•Uche izuoke

•Ike ichepụta ihe ahụrụ anya

•Na ịcheta ihe maọbụ ịmata ihe

Nyocha ọzọ e mere n'afọ 2015 e tinyere n'akwụkwọ 'Journal of Child Psychology and Psychiaty' na-egosi na ka ụmụaka si arahụ ụra nwere ike imetuta agwa na ka ha sị eme n'ụlọakwụkwọ.

Ụmụaka na-arahụ ụra

Ebe foto si, Getty Images

Ibu oke ibu

Nchọcha enwebeghị ike ịkọwa ka ọ nwere ihe jikọtara oke ibu na echumụra, agbanyeghị na-emeela ọtụtụ nnyocha na ya mana Clara sị na onye na-enweta ezumike nke ọma nwere ike ibu ibu.

Adịkwa ama ama, nyocha e mere nsonso a bụ nke e tinyere n'akwụkwọ 'Sleep medicine' kọwara hoohaa na ọnweghị ihe jikọrọ ya bụ udele na baba.

Ha kwuru na-echumụra nwere ike imetuta ka mmadụ si ebi ndụ, mana ọgaghị eme ka mmadụ buo ibu.

Mana ha chọpụtara na ịrahụ ezigbo ụra nwere ike ịme ka mmadụ ghara iri oke nri nke nwere ike ibute oke ibu.

Onye ibu

Ebe foto si, Press Association

Iji maa atụ, otu nyocha e tinyere na "Proceedings of the National Academy of Sceince of the Unted States of America" kọwara na otu mmadụ si ehi ụra nwere ike ịmetuta ka agụụ sị agụ ya.

Ha chọpụtara na ọbụrụ na mmadụ arahụghị ụra ka o kwesiri, ọ na-emetuta ka onye ahụ si eri ihe.

Ịgbasi ike

Dịka ndị National Sleep Foundation nke mba Amerịka si dee, onye kwesiri ị na-arahụ ụra awa asaa ruo itoolu n'abalị.

Ndị na-eme egwuregwu nwere ike ịrahuzu awa iri.

Ha chọpụtara na ụra dị ha oke mkpa dịka ezigbo nri sị dị ha maka ọ na-eme ka ha gbasie ike.

Ọrịa obi

Ọrịa obi

Ebe foto si, Getty Images

Ihe na-ebutakarị ọrịa obi bụ ọbara mgbalielu.

Dịka ndị Centre of Disease Control si kwuo, ịrahụ ụra zuru oke na-eme ka ọbara mmadụ nwee ike ịhazi onwe ya ma gbochikwa ọrịa ndị ọzọ n'ahụ mmadụ.

Ahu mgbaka

Onye enweteghị ụra zuru oke na-enwekarịa ahụ mgbaka.

Dịka akwụkwọ akụkọ MeidcalNewsToday si kọwaa, " ọnwere ihe jikọtara ụra na ka ndị mmadụ sị akpaso ibe ha agwa".

Onye anaghị arahụ ụra zuruoke na-atakasikarị ndị mmadụ.

Nchọpụta a dị n'akwụkwọ "Journal of sleep Research".

Obi ọjọọ

N'otu aka ahụ, nchọpụta na-aga n'ihu ịmata ka ọ nwere ihe jikọtara ọdịmma echiche na ụbụrụisi na ụra.

Otu ihe doro anya bụ na a hụru na ọ nwere ịhe gbasara ụra na obi ọjọo.

Nchọcha a ebipụta na JAMA Psychiatry na-enyocha ndị gburu onwe ha kemgbe afọ iri were hụ na enweghị ụra zuru oke so na ihe butere ha ọnọdụ ịwere ndụ ha.

Onye obi ọjọọ ji

Ebe foto si, Getty Images

Nyocha ọzọ dị na Australian and New Zealand Jourrnal of Pychiatry sị na enweghị ụra zuru oke na-ebutakarị obi ọjọ.

"Ndị agha ime ahụ (immune system) gị ga-agbasi ike. Ụra na-eme ka ịmeahụ gbasie ike, gwọọ ma dozie onwe ya.", dịka ha dere.

Nchọpụta egosila ka ụra si enyere ịmeahụ aka ịbuso nje agha.

Gịnị nwere ike ichummadụ ụra?

Onye echumúra gbara

Ebe foto si, Getty Images

Clara Inneze sị na ihe ndị a nwere ike ibutere mmadụ echumụra.

•Nsogbu ụwa nwere ike ịgba mmadụ echumụra.

•Ọnọdụ echewe echeteghị nwekwara ike ịgba mmadụ echumura.

•Ọria nwekwara ike ịgba mmadụ echumụra

•Obi ọjọọ were ike ịme mmadụ ụra aga n'anya.

•Ọnọdụ ahụike ụbụrụisi

Gịni bụ ụra zuruoke?

Kedụ mgbe ụra ji ezuoke n'ahụ mmadụ?

Lee ka ndị ọkachamara si zaa ajụjụ a.

•Nwa a mụrụ ọhụru (0 - 3) awa 14 - 17

•Obere nwa (ọnwa 4 - 12) awa 12 - 16

•Nwa na-egbe igbe (afọ 1 - 2) awa 11 -14

•Nwa ọtaakara (afọ 3 - 5) awa 10 - 13

•Nwa akwụkwọ praịmarị (afọ 6 - 12) awa 9 - 12

•Ntorobịa (afọ 13 - 18) awa 8 - 10

•Okorobia (afọ 18 - 60) awa 7

•Okenye (afọ 61 - 64) awa 7 - 9)

•Agadi (afọ 65+) awa 7 8

Ihe na-egosi na mmadụ gbara echumụra

•Ịtete n'ime abalị

•Ụra ịtụ mmadụ mgbe onye ahụ kwesiri ịmụ anya

Lekwa ihe ị ga-eme ka ị nwee ike ịrahụ ezigbo ụra

  • Kulie, a rahụzịla ụra mgbe ụra juru gị
  • Gbaa mbọ nwe oge ị ga na-eji anaba kwa abalị
  • Kawa ahụ mee ka ị na-anọ na-ezi na-arụ ọrụ mgbe chi foro.
  • Kawa ahụ kwụsịlata oke ndọlị.

Kedụ ọnọdụ ụra ka gị mma?

Kedụ ka ị sị anọ mgbe ị na-arahụ ụra?

Ị na-amado afọ n'akwa, ka ị na-egbu nkọ, ka ọ bụ egbuaba, ya bụ ịche ihu n'elu, Ka ị na-atụgharị atụgharị kwa mgbe?

Mmụta na-ekwu na ọnọdụ ụra gị nwere ike ịnye aka n'ụdị ụra ị ga-enweta.

Ajọ ọnọdụ nwekwara ike ibutere gị azụ mgbu maọbụ olu mgbu.

O nwekwara ike ịgbachi gi akpịrị me ka ị ghara ikute ume ọfụma butere onye ahụ ọnọdụ Bekee kpọrọ "obstructive sleep apnea".

Ụfọdụ ndị okpokpo akwụkwọ na-asịkwa na ọ nwere ike ịme ka ụnyi ịme ahụ Bekee kpọrọ "toxins' ghara ịna apụ n'ụbụru ngwa ngwa.

Leekwa ọnọdụ dị iche iche e sị ehi ụra na ihe ọ pụtara

Ịmado afọ n'akwa

Onye madoro afọ n'akwa

Ebe foto si, Getty Images

Nchọpụta gosiri na ihe dị ka pasenti mmadụ asaa n'ụwa na-amado afọ n'akwa arahụ ụra.

Mgbe ụfọdụ Bekee na-akpọ ya "prone position".

Ọnọdụ a nwere ike ịbelata ịkwo ụra mana ọ nwekwara ọghọm so ya.

O nwere ike ibutere onye ahụ azụ mgbu maọbụ olu mgbu maka na ọkpụkpụ olu na nke azụ anozigbi nke ọma.

Ha sikwa na o nwere ike ibute mgbanwụ akwara nke ga-eme na ọbara agaghị na-ekwo nke ọma.

Ọ bụrụ na ọnọdụ a ekweghị gị nhapụ, tinye pilo n'isi gi ka ọ mee ka isi gị na olu gị nọrọ ọfụma.

Egbuaba maọbụ Igbuaba "Free Fall Position"

Ịgha aba

Ọnọdụ a bụ ịgha aba maọbụ ichewe ihu n'elu mgbe ị dịna n'akwa ma chewe ihu n'akụkụ.

Mụta gosikwara na ihe ruru pasenti mmadụ asaa n'ụwa na-ehi otu ahụ.

Ha sịkwa na ndị na-ehi otu a na-ekukwa pilo mgbe ụfọdụ.

Ha chọputara na ndị na ehi otu a nwere ike inwe ukwu mgbu maọbụ mee mgbu nke ịweburu ọ ka njọ.

Ọ bụrụ na ị na-ekwo ụra, ọnọdụ a nwere ike ị me ka ọ ka njọ.

Umụnwaanyị dị ime afọ ha kawagoro kwesiri ịgbara ọnọdụ a ọsọ.

Ọnọdụ a dịkwa mma maka na-ọkpụkpụ ọlụ gị na nke azụ gbatiri agbati mgbe ị nọ na ya.

Nke a pụtara na ị gaghị enwe olu mgbu.

Itinye obere pilo n'isi gị mgbe ị ghara aba ka ha sị na ọ bụ ọnọdụ ụra kachasị mma, ọkacha maka ndị na-enwe achaobi Bekee kpọrọ "heartburn'.

Ịdịna teteretee "Soldier Position"

Ịdịla teteretee

Onye dịna n'ọnọdụ a ghara aba ma dowe aka ya abụọ n'akụkụ ahụ ya.

Ndị na-ekpe ekpere ime mmụọ Bekee kpọrọ "meditation" na-anọkarị n'ọnọdụ a.

Nchọcha sị na ọnọdụ a na-ebuta ikwo ura nke ukwuu.

Ha sịkwa gị kpoturu dọkịnta gị maọbụrụ na ịkwọ ụra anaghị ekwe gị arahụ ụra nke ọma.

Ọnọdụ nghasa ọkpa "starfish position"

Ọnọdụ nghasa ọkpa

Onye dịna n'ọnọdụ a chere ihu n'elu maọbụ n'akwa ma chilie aka ya elu.

Ndị na-adịla na ọnọdụ a na-ekwo karị ụra.

Ha nwekwara ike inwe ahụ mgbu dị iche iche.

Igbunkọ

Igbunkọ

Ọnọdụ a ka ndị mmadụ kacha anọ.

Ọ bụrụ na ị na-ekwo ụra, ọnọdụ a nwere ike ị kara gị mma.

Mana ọ dịchaghịrị onye nwere "arthritis" mma.

Mana sayensi chọpụtara na ịgbunkọ nwere ike ịnye aka ka unyi ime ahụ wee ike ịpụ n'ụbụrụ ngwa ngwa mgbe anyị na-ehi ụra.

Mana nchọpụta a ka na-aga n'ihu.

Ọ bụ eziokwu na ọnọdụ a dịka ọ ka ibe ya mma mana nchọcha gosiri na ọ na-ewepụta akaranka Bekee kpọrọ "wringles" n'ihu ma onye ahụ kawa.

Ụfọdụ na-echekwa na ọ na-ebute ara nwaanyi ịda maka na ọ na-eme ka nke Bekee kpọrọ Coopers Ligament" dọtia.

Onye díla ala

Ebe foto si, Getty Images

Ọ nwebeghị nchọpụta gosiri nke a mana ọ bụrụ na egwu ya na-atụ gị, were pilo hido ara gị mgbe ị nọ n'ọnọdụ a.

Ndị na-enwe obi mgbu kwesiri ịhapụ ọnọdụ a maka ịdịna n'azụ maọbụ idịna n'aka ekpe nwere ike ime ka ụda obi onye ahụ na-akpọte ya n'ụra.

Ị dịna n'aka nri nwere ike ịkara ndị ahụ mma.

Ịgba nkụrụnkụ "Fetal Position"

Ịgbnkọ

Nke a bụ ọnọdụ ịgbakụ agbakụ mgbe ị gburu nkọ.

Ụfọdụ na-ekwu na ụmụnwaanyị ka adịna n'ọnọdụ a karịa ụmụnwoke, mana nchọpụta egosibeghị ya.

Mana ha chọpụtara na ọnọdụ a dị mma maka ụmụnwaanyị dị ime maka na ọ na-eme ka ọbara sị na nne na-ekwoga na nwa ga-aga werewere.

Ọ bụrụ na ọnọdụ a na-enye gị nsogbu n'ukwu, itinye pilo n'etiti ikpere gi abụọ nwere ike inyere gi aka.

Akụkọ ga-amasị gị