Sleeping habit: Nrọ ọjọọ a ga-egbochinwu ụjọ ma mmadụ mụrụ anya?

Ụra

Ebe foto si, Getty Images

Ọ bụrụ na ị rọrọ nrọ ọjọọ n'abalị foro taa, o nwere ike ịbụ ezigbo ihe.

Nke a bụ makana ndị nchọpụta ekwuola na nrọ ọjọọ na-eme ka ụjọ belata n'ahụ gị mgbe ị tetara n'ụra.

Ndị nchọputa a nọ na mba Swizaland na Amerịka nyochara etu ụbụrụ mmadụ si anabata nrọ dị iche iche.

Nrọ ọjọọ

Ebe foto si, Getty Images

Ha chọpụtara na nrọ ọjọ na-akwalite etu ụbụrụ mmadụ si anabata ihe ụjọ ma onye ahụ mụrụ anya.

Mana ha chọpụtara na nrọ na-eyi oke egwu a kpọrọ "nightmares" na Bekee, na-emetụta mmadụ n'ụzọ na-adịghị mma.

Dọkita na-ahụ maka ụbụrụ na mahadum nke Geneva, Mahadum nke ụlọọgwụ Geneva dị na Swizaland nakwa mahadum Wisconsin dị n'Amerịka, na-ekwu na e nwereike iji nrọ gwọọ ọrịa nchekasị.

Nrọ ga-akwado gị maka ihe ụjọ na-eme n'ụwa

Nchọpụta a gụnyere ịma ma nrọ maọbụ oke ajọ nrọ enwere uru ọ baara mmadụ ma ncha.

Mpụtara ya, nke e tinyere na ngalaba 'Human Brain Mapping' gosiri na ajọ nrọ na-enyere ndị mmadụ aka ka ha nabata ihe ụjọ na-eme na ndụ ha.

Ka ajọ nrọ na-abawanye, ka ikike ibelata ụjọ na-abawanye n'akụkụ ụbụrụ na-ahazi etu mmadụ si anabata ụjọ.

Nke a gosiri na nrọ ọjọọ na-akwado ndị na-arọ ya maka etu esi agbanarị ụjọ ma ha teta n'ụra.

Mana nrọ ahụ jiri oke ajọ ụjọ bịa, o nwereike imebi ihe na ndụ mmadụ dịka Lampros Perogamvros onye nchọpụta na mahadum Geneva si kwuputa.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Ihe nkiri a ga-amasị gị:

Aha onyonyo, World Aids Day: HIV n'ọnụ ọgụgụ