Chelsea vs West Ham: A kpọọla Chelsea ntu n'isi na be ha

Pedro

Ebe foto si, Getty Images

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Obi na-agbawa ndị na-akwado Chelsea ugbua maka etu ndị West Ham ji were ha gbụchara ọnụ.

Goolu Aaron Cresswell nyere n'ime nkeji 48, zuru ịkpọnye ntu n'obi nakwa n'akpati ndị Chelsea, makana ha asatanwughi otu mkpụrụ goolu ahụ.

Na nkeji 71, a gụfuru goolu Michail Antonio nyere, dịka e kwuru na aka metụrụ ya.

Ndị Chelsea gbara elu gbaa ala, mana isi ha apụtaghị n'agbanyeghi nkeji ise e tinyekwuru n'egwuregwu ahụ a gbara na Stamford Bridge.

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post

Nke a bụkwanụ mmeri mbụ West Ham na-emeri Chelsea na Stamford Bridge n'ime afọ 17.

Chelsea ga-ezute Aston Villa n'ụbọchị anọ nke Disemba, ma zutekwa Everton n'ụbọchị asaa nke ọnwa ahụ.

Man City a na-akwọzị mmiri ka azụ?

Kevin De Bruyne

Ebe foto si, Getty Images

Ndị Newcastle enyeghi Manchester City ohere imebọ ha n'ọgbọegwuregwu St James Park ka ha lere ha ọbịa taa.

Ha ji goolu na-asa onwe ha okwu, ghara imenye onwe ha ihere n'azụ ụlọ ha ka ndị Man City buteere ha egwu.

N'ime nkeji 22 e ji bido bọọlụ ka Raheem Sterling gbakara neetị Martin Dubravka, mana Jetro Willems sara ya na nkeji 25 iji sị ha 'kwanyere onwe ha ugwu o'.

Man City megidere nweta goolu ọzọ na nkeji 82, site n'aka Kevin De Bruyne, mana Jonjo Shelvey sara ya na nkeji 88, iji sị ha 'gbara ọgwụ ha ṅụọ'.

Onye lawa onye lawa ha gbatara, mere ka Man City nweta otu pọịntị n'ime atọ; ma mee ka ha nọrọ na pọịntị 29.

Nke a mere ka Liverpool bụ ndị ha na ha na-azọ onye ga-anọ n'isi tebulu, jiri pọịntị 11 na-aga ha ugbua.

Ha ga-ezute Burnley n'ụbọchị atọ nke ọnwa Disemba, ma zute oke iro ha bụ Manchester United n'ụbọchị asaa.

Akụkọ ga-amasị gị:

Ihe nkiri a ga-amasị gị:

Aha onyonyo, Lee Ugwuta, obodo ọma nọ n'akụkụ mmiri