Liverpool vs Manchester City: Liverpool apịwaala Man City ọnụ ka ụdara ụgụrụ

Van Dijk na Mane

Ebe foto si, Getty Images

Ndị Liverpool gosiri ndị Manchester City nkarị na mgbede ụbọchị ụka n'asọmpi "English Premier League".

Ọkpụ goolu atọ chara acha ka ndị akwa ọbara ọbara ji pịwaa ndị akwa anụnụ anụnụ ọnụ ka ụdara.

Tupu asọmpi a ebido, onye ọbụla nọ na-ekwu na ọgụ ahụ ga-aka aka.

Mana ngwangwa egwu malitere Liverpool gosiri ihe ha ji bụrụ di na-alụ ndị Man City.

Naanị nkeji asaa ka o were Fabinho iji were 'shot' dịka egbeigwe gbawaa neetị ndị Man City.

O teghi aka Mohammed Salah mezuo ya abụọ na nkeji 13.

Mo Salah

Ebe foto si, PA Media

Nkọwa foto, Mohammed Salah nyere goolu nke abụọ

Man City malitere ịgba lịkalịka ka ndi mmiri na-eri mana nke ahụ amịtaghị mkpụrụ.

Mkpu niile ha tiri ka igwe VAR nye ha penariti oge bọọlụ kụrụ Alexander-Arnold n'aka dara n'ala aja.

N'agba nke abụọ, Mane mezuru ya goolu atọ nke mere ka ndị Man City tọkịrị.

EPL table
Nkọwa foto, Ka ọ dị ugbua

Nke a pụtara na Liverpool jizi akara itoolu agafe Man City na tebulu EPL.

Man City bụzị ndị nke anọ.

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ga-amasị gị:

Ihe nkiri ga-amasị gị:

Aha onyonyo, 'Agaghị m agbatịnwu aka m mana a ga m agbatịnwu ụbụrụ m'