Manchester United vs Brighton: Man Utd emewela ụwa 'shut up'

Ebe foto si, PA Media
Ndị otu egwu bọọlụ Manchester United mere ka ọbụghị ha taa mgbe ha ji ọkpụ goolu atọ a satara otu merie ndị Brighton
Nke a mere ka ha gbagote n'ogo ndị nke asaa na tebulu 'English Premier League'.
Oteela Man Utd gbawara ọnyụpa n'asọmpi a mana ha biliri n'ụra taa.
Ndị nyeteere ha goolu gụnyere Pereira na Marcus Rashford.
Propper, onye Brighton, ji aka ya nye onwe ha goolu nke mezuru ya atọ, ebe Dunk satara otu goolu.

Rashford bụ nnọọ okwu a kpụ n'ọnụ taa n'ihi etu o si chakee ka kpakpando.
Ọ gaara enyekarị otu goolu mana oche bọọlụ ndị Brighton gbalịrị nke ukwuu.
Mana ofu ihe ka na-ara ndị Man Utd ahụ bụ igbochi ndị mmadụ inyeta ha goolu.
Kamgbe afọ bọọlụ 2019/2020 malitere n'ọnwa Ọgọst, naanị ugboro abụọ ka Man Utd gbochirila ndị mmadụ inyete ha goolu.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:
Ihe nkiri ga-amasị gị:











