Man City vs Chelsea: Gaurdiola egosila Lampard na ọ bụ egwu bọọlụ kwọchara ya isi

Lampard na Guardiola

Ebe foto si, AFP/Getty Images

Nkọwa foto, Lampard na ekele onye bụbu onyenkụzị ya n'egwu bọọlụ bụ Pep Guardiola

Mancheter City na Chelsea, otu egwu bọọlụ abụọ bụ oji isi aghọ mgbọ kwatara ya taa na Premia Lig na aka ogbuọja Martin Atkinson bụ ebe Manchester City nọ merie Chelsea ọkpụ abụọ asatara otu.

Taa Frank Lampard na 'ọga' ya bụ Pep Gauardiola siri ọnwụ n'imi taa ebe N'Golo Kante gosiri Manchester City na azụ sungu ka nọkwa n'ụtọ mbụ ya site na-ịnye City goolu mbụ na nkeji 21'.

Manchester City gosiputara iwe ha na nkeji 29' mgbe Kevin De Bruyne mere Chelsea taa kpụchie ọnụ site n'ịsa ya bụ goolu.

Ọ dị ka nke ahụ ezughị, Riyad Mahrez were ọkpụ goolu nke abụọ dulaa Chelsea ezumike n'agba nke mbụ site na goolu ahụ ọ nyere na nkeji 37'.

Na nkeji 40, Chelsea ji nwa pem gbalahụ penarity dịka Kepa Arrizabalaga tinyere Sergio Aguero ọkpa, mana ogbuọja ahụghị ya.

Willian nwa Brazil

Ebe foto si, AFP/Getty Images

Nkọwa foto, Willian nke Chelsea gbafuru bọọlụ ebe ndị Man City chụpadoro ya ọsọ

Chi ndị Chelsea mụ anya.

VAR kwuru na goolu nke ikpeazụ Sterling nyere esoghị ya.

Nke ahụ ka Man City kaara iji mechie ya bụ egwuregwu.

Cheta na agbanyeghị na Man City kpotere nturu ugo ekpote na sizin gara aga, ọ bụghị taa ka Chelsea gbuwere ha ilu.

Chelsea emeriela ha ugboro ise na premia Lig.

Cheslea emeriela Man City otu ugboro na be ha n'ime ugboro atọ ha sọgoro mpi.

Kepa Arrizabalaga

Ebe foto si, AFP/Getty Images

Nkọwa foto, Obi wara Kepa Arrizabalaga nke Chelsea mmiri mgbe goolu Sterling gafere ya

Agbanyeghị, cheta na Man City gwọrọ ha ka abacha mgbe ha ji ọkpụ isii gbanye ha ihere na sizin nke so nke a.

Mana ị ga-asị na ihe a bụ ọbọ ka Man City bọrọ maka ihe Chelsea mere ha na sizin nke 2007/08 bụ ebe ha jikwa ọkpụ isii asataghị ihe nyụọ ha Ịkpakwụ.

Ndị otu egwu bọọlụ abụọ a bụcha tachịị nke bụ na Chelsea bụ ihe ji nturu ugo ọkwa abụọ dịka otu kacha emeri asọmpị ha gbara na be ndị ọzọ.

Lampard so na ndị nkụzị bọọlụ asaa e meribeghị ugboro isii so onwe ha n'azụ ha gbara bọọlụ na Premia Lig.

Akụkọ ga-amasị gị