Sexual Education: Ihe ise ndị nwere amụ kwesiri ịma maka ya

Amụ

Ebe foto si, Getty Images

    • Onye dere ya, Chioma Obianinwa
    • Ndị mere akụkọ a, Senior Broadcast Journalist, Igbo

Ọtụtụ nchọpụta apụtala maka ndozi ọtụ ụmụnwaanyị.

Mana nchọpụta nke a bụ maka etu esi elekọta amụ, akpa amụ na ihe gbasara akụkụ ọmụmụ nwa nwoke.

Dọkịnta na-ahụ ma maka ọmụmụ amụ na akụkụ ọmụmụ ụmụnwoke bụ Dọkịnta Chuks Osegbe akọwapụtala ihe ise onye ọbụla nwere amụ kwesiri ima.

Ọ sị na amụ bụ otu ihe dị n'ahụ nwoke na adịghị n'ahụ nwaanyị. Mana ugbua, e nwere ndị na-abụghị nwoke na-enwe amụ, mana ọ bụghị akụkọ anyị taa.

Ngwa bute oche gụọ ihe ndị a dọkịta Osegbe kpọpụtara dịka ihe i kwesiri ịma maka amụ ụmụnwoke, ihe Beke kpọrọ 'Penal Care':

1. Amụ na-agbajinwu agbaji dịka kpụkpụ

Ọtụtụ ụmụnwoke na-eche na amụ adịghị agbajinwu agbaji.

Ụfọdụ akpọla ya akwara.

Mana dọkịta Osegbe kwuru na nke ahụ abụghị eziokwu.

Mgbe amụ ga-agbajinwu agbaji dịka ọkpụkpụ bụ mgbe o keliriekeli.

Ya mere Osegbe ji dụọ ọdụ na a ga-ejiri nwayọọ na-ara ọtụ ma amụ gị kenie ka ọ ghara ị gbajipụ

2. Iji amụ pasie ọkụ ike abụghị ihe na-atụba nwaanyị ime

Obere amụ

Ebe foto si, Getty Images

Dọkita Osegbe kwuru na ọ bụ uhe (sperm) 'zuruoke' na-eme ka nwaanyị tụrụ ime ma ọ banye n'ọtụ, ọ bụghị etu i si lasie ọtụ ike.

3.Nkeli amụ na ibu amụ

Ọ bụghị nkeli amụ na-ebute ibu amụ.

Nnukwu amụ kelie, o nwereike ibutu Ibu, ebe obere amụ nwereike ibu karịa etu ọ ha ma o kelie.

4.Amụ na-agba ọbara maọbụ chagharịa agbaghị aka

Mgbe ọbụla amụ bidoro gbawa ọbara, mara na enwere ebe mmiri si baa opi ụgbọgụrụ.

Dọkịta Osegbe kwuru na nke a gosiri na ọria emetụtala amụ.

Ọ na-adụkwa ọdụ ka nwoke ọbụla chọpụtara ụdịrị ihe a maọbụ ọziza, ịkọ ọkọ (ọkọ T-Junction), nchagharị etu amụ si acha, gaa nyochaa n'aka dibịa ahụike ka ọ mara ụdịrị ọrịa ọ bụ ma nweta ezi ọgwụgwọ.

5. Amụ na-akwụ ọtọ mgbe niile kwesiri kaagbatara ya ọsọ enyemaka

Nwanne ọ bụrụ na mgbe ọbụla amụ gị na-ekeli ekeli, tụmadị mgbe ị naghị ara ọtụ, dọkịta Osegbe kwuru na nke a adịghị mma.

O kwuru na amụ nọ na nkeli mgbe ọbụla, ga na-agabiga ụfụ dị egwu.

O kwuru na ihe na-ebutekarị ọnọdụ a bụ ụmụ ọgwụ ụfọdụ ụmụnwoke na-aṅụwa maka ikwalite ịra ọtụ.

Akụkọ ndị ga-amasị gị